30.8 C
Nigeria
Monday, May 20, 2024

Soludo Agwala Ndị Anambra Bi Lagos Ka Hà Welataruo Àkụ̀ Ha Ụlọ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ akụ ruo ụlọ a mara onye kpara ya; maka na ọ na-adị mma mbazụ gwute ọgwụ, ọ laa azụ.

Ka ọ dị taa, a kọwaala mkpa ọ dị na onye ọbụla bụ nwaafo steeti Anambra bi na mpaghara ebe dị icheiche n’ala Nigeria nà mba ofesi rube isi nye ọkpụkpọ oku ‘Akụ Ruo Ụlọ’ gọọmenti steeti ahụ na-akpọ, ma welataruo àkụ ya ụlọ.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ ya kpọnwòrò òkù a ọzọ n’okwu ya na nnukwu ọgbakọ pụrụ iche ya na ndị Anambra bi na Steeti Lagos nwere na nsonso a na Lagos.

N’okwu ya n’ebe ahụ oge ọ na-akọwapụ̀ta ihe dị icheiche o mepụtagoro na ngalaba dị icheiche na steeti Anambra, ya bụ Gọvanọ mere ka a mara na ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ akwalitela ezi ọnọdụ nchekwa ma mekwa ka ọnọdụ dị larịị maka ndị ji ego achụ ego, ya na iji mee ka azụmahịa na ọrụ na-agawanye n’ihu n’ime steeti ahụ.

Dịka ọ na-ekele ndị ọrụ nchekwa dị icheiche maka agbambọ ha n’iweghàchite ezi ọnọdụ nchekwa n’Anambra, o kèlèkwàrà ụfọdụ ụmụafọ Steeti ahụ ndị welataruru àkụnụba ha ụlọ wee rụọ ụfọdụ ụlọ mmepụta ngwaahịa, ụlọọrụ, ụlọ nkwariakụ, na ihe ndị ọzọ, ọbụna dịka ọ gbara akaebe na nke ahụ na-enye aka n’ụzọ pụrụ iche n’ịkwalite ọrụ mmepe ahụ ọ na-arụ na steeti ahụ ma nyekwa aka n’ikewàpụtara ndị ntorobịa steeti ahụ ohere ọrụ.

Ya bụ Gọvanọ jizịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ndị Anambra ahụ nọ na Lagos ka ha na-echeta na o nwere ebe ha si, ma chetekwa na ọ na-abụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya. Ọ sị na iwèlàtàru akụnụba ha ụlọ ga-enyekwa aka kwàlite ọnụego na-abàta n’àkpà gọọmenti steeti ahụ, bụkwa nke ga-enyere gọọmenti aka n’ọrụ mmepe ya n’ime steeti ahụ.

Dịka ọ na-akọwa na gọọmenti ya bù ọdịmma steeti ahụ na ụmụafọ ya n’obi, ma na-agbasikwa mbọ ike ịkwàlite ya oge niile; ya bụ Gọvanọ kewèrè nkwà na ọchịchị ya ga-aga n’ihu ịtụpụta na ịbàgide n’ọmarịcha atụmatụ dị icheiche ga-akwàlite ezi ọnọdụ obibindụ Ndị Anambra, na ọganihu nà mmepe steeti ahụ n’izugbe. Ọ kpọkukwara ụmụafọ steeti ahụ nọgasị na steeti ndị ọzọ dị icheiche ka ha gaa n’ihu inye ọchịchị ya nkwàdo iji kwụdosie ike n’ezi ọrụ dị icheiche o ji n’aka na steeti ahụ.

Na ntụnye nke ha n’otu n’otu, ọtụtụ ndị sonyere na mmemme ahụ na ndị ọzọ kwuru okwu n’ebe ahụ kelèkwàzị̀rị̀ ndị chịkọbara ya bụ ọmarịcha ọgbakọ, gwa ha ka ha jide ka ha ji; ọbụna dịka ha kwere nkwà ịza òkù ahụ a na-akpọ ha maka iwèlàtàru akụnụba ha ụlọ. Ha kwupụtakwara mkpa ọ dị ka a na-akwàlite asụsụ Igbo na omenala dị icheiche e jiri mara ndị Igbo.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles