30.8 C
Nigeria
Monday, May 20, 2024

Oriakụ Soludo Etinyela Ndị Nkụzi Anambra n’otu Obibindụ Ahụike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Nonye Soludo, nọrọ na nsonso a wee nabata ndị nkụzi sitere ụlọakwụkwọ dị icheiche na steeti ahụ n’otu Obibindụ Ahụike ya, bụ “Healthy Living Club”, nke a makwa dịka “Healthy Living with Nonye Soludo”.

Mmemme ịnabata ndị ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nabata ndị nkụzi karịrị narị abụọ n’ọnụọgụgụ n’otu ahụ.

N’okwu ya na mmemme ahụ, Oriakụ Soludo kọ̀wàrà na ebumnob o jiri hibe ya bụ òtù ma nabatakwa ndị nkụzi ahụ bụ iji kwàlite ma gbaziere ọhaneze, ọkachasị ụmụakwụkwọ, etu ha ga-esi kwàlite ọnọdụ ahụike ha site n’ụdị ndụ ha na-ebi kwà ụbọchị.

O kwuru na ndị nkụzi ahụ na ndị ọzọ bụ ndị òtù ahụ ga-abụ ndị nnọchianya ya bụ òtù n’ụlọakwụkwọ ha dị icheiche na n’ebe ndị ọzọ ha hụtara onwe ha. Ọ dụ̀kwara ndị nkụzi ahụ ọdụ ka ha hụta ya dịka ọrụ ha ịzụlite ụmụakwụkwọ ha n’obibindụ ziri ezi, ọkachasị dịka o siri metụta ahụike ha.

Ọ gbarụ̀rụ̀ ihu banyere etu ụfọdụ ndị nne na nna sizị̀ eleghara ọrụ dịịrị ha anya n’ihe gbasara ịzụ̀lìtè ụmụaka n’ụzọ kwesiri ekwesi ma kụnyekwa mkpụrụ ọma na ezi akparamagwa n’ime ha, dịka ọ dị n’oge gboo. O mekwara ka a mara na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na ọtụtụ ndị nne na nna anaghịzị enwe maọbụ wepụ̀ta oge maka ụmụ ha ugbua, ma ya fọ̀dụzie ha na ha ịkparịta ụka dịka nne na nwa, iji jụọ ha ajụjụ ụfọdụ maọbụ nụ ihe ụfọdụ ha nwere ike ikpesa.

Oriakụ Soludo jikwara ohere ahụ dụọ onye ọbụla, ọkachasị ụmụnwaanyị, ọdụ ka ha gbaa mbọ hụ na ụmụaka ha na-sonyesie ike n’atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi dị icheiche a na-agba na mgbe na mgbe na steeti ahụ, n’ihi ọtụtụ uru dị icheiche nke ahụ na-eweta.

Ọ dọ̀kwara onye ọbụla aka na ntị ka ọ na-adị ọcha ma na-edebekwa gburugburu ya ọcha oge niile, n’ihi na ezi ọnọdụ adịmọcha so n’otu ụzọ kachasị mmadụ pụrụ isi kwalite ahụike ya ma gbochie maọbụ gbanahị ụdị ọrịa dị icheiche dị aṅaa.

Ọ katọ̀rọ̀ etu ịṅụ na ịkpọ ọgwụike si arịzị ibe ya elu ugbua n’ụlọakwụkwọ dị icheiche, ọkachasị ma n’ogoogo sekọndịrị, ma mee ka a mara na nke ahụ so n’ihe na-eweta ala adịghị mma n’obodo, sịkwa na ihe dị etu ahụ na-arụje aka na ọdịnihu ga-akawanye njọ ma ọ bụrụ na e meghị ihe ngwangwa banyere ajọ ọnọdụ ahụ.

Na ntụnye nke ya n’ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka Ahụike na steeti Anambra bụ Dọkịta Afam Obidike kèlèrè Oriakụ Soludo maka ọmarịcha atụmatụ ahụ, bụ nke ọ kọ̀wàrà dịka nke dị oké mkpa ma bakwa oké uru, ọkachasị n’ihi ụzọ dị icheiche ọ pụrụ isi nye aka n’ịkwàlite ọnọdụ ahụike ụmụ mmadụ na steeti ahụ.

Dịka ọ na-adụ onye ọbụla ọdụ ka ha were ahụike ha kpọrọ ihe ma na-elerukwa onwe ha anya nke ọma oge niile, ya bụ Kọmishọna kpọkùkwazị̀rị̀ ndị Anambra ka ha gaa n’ihu ikwadò na isonye n’otu ahụ na ihe dị icheiche ha na-eme, iji hụ na ebumnobi ya pụtara ìhè, o wee mịtakwa mkpụrụ a tụrụ anya.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka Ndị Ntorobịa n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Patrick Aghamba; onyeisi òtù ahụ, bụ Oriakụ Ezinwanne Oti, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ. A nọkwara na mmemme ahụ mee ngagharị ma nyekwa nkụzi megide ịkpọ, ịṅụ, ire, maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n’ụdị ọbụla n’ime steeti ahụ.

Na nzaghachi ya n’aha ndị òtù ya, otu onye n’ime ndị nkụzi ahụ, bụ Oriakụ Ugochukwu Anyafulu, na otu n’ime ụmụakwụkwọ sonyere na mmemme ahụ, bụ Nwaada Chinemerem Ofoleta, kèlèrè Oriakụ Soludo na ndị òtù ahụ maka ezi ohere ọma ahụ, ma kwe nkwà iburu ozi ahụ gaa gbasaa n’ụlọakwụkwọ na ime obodo ha dị icheiche.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles