23.5 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

Onyeisi Uweojii Ọhụrụ Awụchaala n’Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-adị mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ.

N’ịgbasò nke a, isi ụlọọrụ uweojii n’ala Nigeria akpọlitela CP Aderemi Olufemi Adeoye n’ọrụ dịka onyeisi ndị uweojii ọhụrụ na steeti Anambra.

Nke a bụ nke e kwupụ̀tàrà site n’ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ Police Service Commission Ikechukwu Ani, onye mekwara ka a mara na onye jigodi ọkwa dịka Onyeisi uweojii n’ala Nigeria, bụ Kayode Egbetokun kpọlitekwara mmadụ asaa ọzọ n’ọkwa dịka ndịisi uweojii steeti asaa ndị ọzọ na mpaghara ebe dị icheiche n’ala Nigeria.

Dịka o siri kwuo, ndị ọzọ ahụ a kpọlitekwara n’ọkwa gụnyere Godwin Aghaulor, (steeti Bornu); Adelesi E. Oluwarotimi, (steeti Kwara); Adebola Ayinde Hamzat (steeti Oyo); Augustina Ogbodo (steeti Ebonyi); na Samuel Titus Musa (steeti Kebbi).

Ndị ọzọ gụnyere Stephen Olarewaju (steeti Imo) na Alamatu Abiodun Mustapha (steeti Ogun).

Site na mkpọlite ahụ a kpọlitere ya n’ọkwa ahụ, CP Aderemi Olufemi Adeoye nọchizị̀rị̀ anya Onyeisi uweojii nke pụrụ apụ na steeti Anambra, bụ Maazị Echeng Echeng, onye ebbuliri n’ọkwa ọhụrụ na nsonso a dịka ‘Assistant Inspector-General of Police (AIG)’.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles