38.7 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

Ọgwụ Mgbochi Bụ Isi n’Ịkwàlite Ahụike Ụmụaka— Oriakụ Soludo

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Nonye Soludo adụọla ndị Anambra, ọkachasị ụmụnwaanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara, ọdụ ka ha sonyesie ike n’atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi ahụ na-aga n’ihu ugbua na steeti ahụ.

Oriakụ Soludo kpọrọ oku a n’Awka, na mmemme ịgbape Izuụka Ahụike Nne na Nwa (Maternal, Newborn Child Health Week), bụkwa ebe ọ nọrọ kọwaa ya bụ ịgba ọgwụ mgbochi dịka otu n’ime atụmatụ ọchịchị di ya bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ji n’aka ugbua iji memilaa ọrịa dị icheiche na-efe efe ọsọ ụkwụ eru ala na steeti Anambra.

Dịka o siri kọwaa, izuụka ahụ bụ maka inye nlekọta ahụike maka ụdị ọrịa dị icheiche, ime nnyocha maka ọrịa dị icheiche, na inyekwa ọgwụgwọ, bụkwa nke a na-emegbado n’efu.

O nyere nkọwa banyere ụdị ọgwụ dị icheiche a ga-agba, ma gbakwa akaebe na nsonye ahụ gọọmenti steeti ahụ na-esonye na nkwàdó ọ na-enye atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa na steeti ahụ enyela aka n’ụzọ pụrụ iche n’imezùpụ̀tà ebumnobi atụmatụ ahụ.

Ọ kọwakwara na ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo mere ka ya bụ ọgwụ mgbochi ọrịa bụrụ nke a na-agba n’efu, ka o wee rute ezinụlọ ọbụla, ma ndị nwere ego ma ndị ihe dịịrị aṅaa.

Ọ dụkwara Ndị Anambra, ọkachasị ndị nwere nwatakịrị na ndị dị ime ka ha na-esonyesikwa ike n’atụmatụ ahụike ahụ, n’ihi oké uru nke ahụ bara n’ịkwàlite ezi ọnọdụ ahụike ụmụaka ahụ.

Oriakụ Soludo jikwara ohere ahụ dọọ onye ọbụla aka ná ntị ka ọ na-adị ọcha ma na-edebekwa gburugburu ya ọcha oge niile, n’ihi na ezi ọnọdụ adịmọcha so n’otu ụzọ kachasị mmadụ pụrụ isi kwalite ahụike ya ma gbochie maọbụ gbanahị ụdị ọrịa dị icheiche dị aṅaa.

Ọ dị ncheta na gọọmenti steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee gbapee ya bụ amụma ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa na steeti ahụ, bụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ, ndị bịara isonye na ya bụ mmemme na ndị bịara ịgba ụmụ ha ọgwụ mgbochi ebe ahụ.

Na ntụnye nke ya n’ebe ahụ ụbọchị ahụ, Onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Primary Healthcare Development Agency (ASPHCDA)’ bụ Dọkịta Chisom Uchem nyekwuru nkọwa banyere ya bụ ọgwụ mgbochi ọrịa, bụ nke o kwuru a na-agba site na njikọaka gọọmenti steeti ahụ,

Ọ kpọpụtasị̀rị̀ uru dị icheiche dị na ya, ọkachasị dịka o siri metụta ibelata ọnwụ ụmụaka; mee ka a mara na ya bụ ọgwụ mgbochi bụkwazị nke a ga na-agba n’ụlọ ahụike ntà niile dịgasị na steeti ahụ ahụ, ya na ụlọọgwụ gọọmenti, ụlọakwụkwọ, ụlọụka, na ogige ebe ndị ọzọ dị icheiche.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles