26.5 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

A Ga-anwụchi Onye Ọbụla Ji Ụmụaka Arịọ Arịrịọ n’Anambra — Kọmishọna Obinabo

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-adị mma ibu ụzọ ma ọkwa mmiri tupu ozuzo ya.

N’ịgbaso nke a, Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze n’ime steeti Anambra, bụ Oriakụ Ify Obinabo adọọla aka na ntị ọzọ ma mee ka a mara na gọọmenti steeti ahụ ga-anwụchikọ ma kpụpụ ụlọikpe, onye ọbụla a hụrụ ka ọ na-emekpa ụmụaka ahụ maọbụ jiri ụmụaka arịọ arịrịọ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ.

Kọmishọna Obinabo kwupụtara nke a n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra oge o nwetechara mkpesa banyere di na nwunye na-edunye nwatakịrị ịga ere ahịa mbugharị.

Akụkọ kọrọ na di na nwunye ahụ, bụ Maazị Patrick Okechukwu na Oriakụ Perpetual Okechukwu kpọtara nwakịrị ahụ akpọta ma na-edunye ya ịga ere oroma mgbe ụmụaka ibe ya nọ n’ụlọakwụkwọ.

Kaosiladị, di na nwunye ahụ gọrọ aka na ụkwụ ha, sị na ha amaghịdị na nwatakịrị ahụ na-aga ere ahịa mbugharị ma ọ bụrụ na ha zipu ya akwụkwọ. Ha kwukwara na nwatakịrị ahụ na-esokwa ụmụ ha agụ akwụkwọ n’ụlọ n’abalị ma ha lọtachaa, nke mezịrị na ha chekwa na ọ na-agụ akwụkwọ; mana ha amaghị na ọ na-aga erere mmadụ oroma ma e dupu ya ịga akwụkwọ.

Akụkọ kọkwazị̀rị̀ na ọ bụ otu onye nwere obi ebere nyere Kọmishọna mkpesa ahụ oge ọ hụrụ nwatakịrị ahụ gbara afọ iri ọtụtụ mgbe ka ọ na-ebugharị oroma na mpaghara ‘Sokoto Road’ dị n’Onitsha. Onye ahụ wetere ya bụ ozi kwuru na nwata ahụ adịghị mma n’anya ọtụtụ ugboro ọ hụgoro ya, tinyekwuoro na ọ na-aga ka onye ike gwụrụ na onye agụụ na-agụ.

N’okwu ya banyere nke ahụ, Kọmishọna Obinabo kwuru na ya na nwata ahụ ka ga-anọ̀godi ugbua ka ọ na-elekọta ya anya, ruo mgbe a kpọtara ndị bụ nne na nna mụrụ ya, tupu ha akpọrọ ya laba be ha.

Dịka ọ na-akatọ̀ ibunye nwatakịrị ahịa mbugharị n’ụdị ọbụla; ya bụ Kọmishọna, gbarụkwara ihu banyere etu ịrịọ arịrịọ sizị jupụ̀ta na steeti ahụ ugbua, ma ndị nke na-arịọrọ onwe ha, ma ndị nke ji ụmụaka arịọ, bụ ụmụaka kwesiri ịnọ n’ụlọakwụkwọ so ibe ha na-agụ akwụkwọ.

Ọ katọ̀kwarà etu ụfọdụ ndị mmadụ ahụ zuru oke sizịrị jiri arịrịọ wee merezie aka ọrụ n’Anambra, ma kwuo na gọọmenti ga-anwụchikọ onye ọbụla na-eme maọbụ na-etinye aka n’ụdị ihe dị icheiche dị etu ahụ.

Kọmishọna Obinabo kpọkùzịkwara ndị ọbụla na-eme ihe dị òtù ahụ ka ha sepu aka na ya maka na onye ọbụla a ga-enweta ga-eji anya ya abụọ wee hụ ntị ya na-ejighị ènyò.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles