23.2 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

Ụmụnwaanyị Dayọsis Aguata Emeela Nnukwu Ọgbakọ Izugbe n’Eziagu

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Agba nke iri na asatọ nke nnukwu ọgbakọ izugbe otu jikọtara ụmụnwaanyị ụka Anglịkan na Dayọsis Aguata abịala na njedobe n’Eziagu dị n’okpuruọchịchị ime obodo Orumba South nke steeti Anambra.

Ya bụ ọgbakọ omenahọ bụ nke a maara na bekee dịka ‘Aguata Diocesan Women Conference’, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya kpaa ma tinye ọnụ n’okwu dị icheiche metụtara òtù ụmụnwaanyị na dayọsis ahụ, gbasaa Ozi Ọma alaeze eluigwe, ma tinyekwa ọnụ n’okwu metụtara ọchịchị ala Nigeria.

Mmemme ahụ isiokwu ya bụ gbadoro ụkwụ n’ụkpụrụ maka ejemozi ga-eweta mnwògharị, ma bụrụkwa nke onyeisi otu jikọtara ụmụnwaanyị, ndị nne na ụmụagbọghọ n’ime dayọsisi ahụ, bụ Oriakụ Chinyere Ezeofor nọ n’isi ya.

Ya bụ oke mmemme wééré ọnọdụ n’ụlọụka St. Matthew’s Parish, Eziagu, dọtàkwàrà onyeisi nchụaja na dayọsisi ahụ, bụ Bishọp Samuel Ezeofor, ndị ndu obodo, ndị ọrụ ụka, na ọtụtụ ụmụnwaanyị sitere ụlọụka dị icheiche dị na dayọsisi ahụ na mpụ̀ga ya.

N’ozi pụrụ iche ọ gụpụtàrà na mmemme ahụ, Oriakụ Ezeofor kpọkuru onyeisiala Nigeria, bụ Bola Tinubu ka o teta n’ụra n’ibu agha megide nsogbu dị icheiche na-echere ala Nigeria na ajọ ọnọdụ dị icheiche ụmụafọ Nigeria na-agabiga, nke gụnyere ajọ ọnọdụ nchekwa, oke ngalaọnụ nke ihe dị icheiche a na-erebụ ọnụ ala n’oge mbụ, enweghị ezi ọnọdụ obibindụ, tínyéré ajọ ọnọdụ ndị ọzọ dị ka ha, bụkwa nke o kwuru na ha na-akawanye njọ kwa ụbọchị.

Ọ gbarụrụ ihe banyere etu e si egbusi, na-atọrọ, ma na-ememilakwa ndụ ụmụ mmadụ na mpaghara ebe dị icheiche n’ala Nigeria ugbua, ma dụọ onyeisiala Tinubu ka o welitekwuo aka n’ọrụ na mbọ ahụ a na-agba imemilà ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ na-arịzị ibe ya elu n’ala Nigeria ugbua, ma weghàchitekwa ezi ọnọdụ nchekwa n’ala Nigeria ọzọ, site n’ime ka nchekwa soro n’ihe mbụ ọchịchị ya na-etinyekarị uchu na ya.

Oriakụ Ezeofor gara n’ihu nye nkọwa banyere nnukwu mmemme ọgbakọ ụmụnwaanyị ahụ, ma dụkwa ọhaneze, ọkachasị ụmụnwaanyị ka ha guzosie ike na Chineke oge niile, n’agbànyèghị etu ọnọdụ siri dị, maka na Chineke pụrụ ime ihe niile nye ndị tụkwasịrị obi na Ya. Ọ kpọkukwara onye ọbụla bụ onye ndu ka ha na-eze ozi ha n’ikwesi ntụkwasịobi.

Na ntụnye nke ya, Bishọp Ezeofor dụrụ ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha bụrụ ezi nne ma na-arụkwa ọrụ dịịrị ha n’ezinụlọ ha na n’ịzụlite ụmụ ha n’ụzọ kwesiri ekwesi. Ọ gwakwara ha nyòchagharịa ndụ ha, iji hụ na ha na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ oge niile, iji wee soro na ndị ga-eketa òke n’alaeze Ya n’ụbọchị ikpeazụ, maka na ọ bụ nke ahụ bụ ihe kacha mkpà.

Bishọp Ezeofor kpọkuru ndị ndu ka ha cheta na e nwere ebumnobi ha jiri nọrọ n’ọkwa ọbụla ha nọ ma na-emezuputekwa ya bụ ebumnobi. O kwupụtàkwàrà mkpa ọ dị ikpere ala Nigeria na ndị ọchịchị ekpere oge niile, n’ihi na ala Nigeria nọ na nnukwu nsogbu ugbua, bụkwa ọnọdụ ekpere na ụmụnwaanyị dị uchu pụrụ ịgbanwè. O chetàkwààrà ha na ụmụnwaanyị nwere ọtụtụ ọrụ dị iche iche dịịrị ha n’ịkwàlìtè ọdịmma na mmepe obodo; ma kpọkuzie ha ka ha bụrụ ezi nwaanyị na-ewulite obodo ewulite n’abụghị ịbụ ndị na-akwada akwadà.

Mmemme ahụ dọtàkwàrà eze ọdịnala obodo Eziagu, bụ Igwe Benard Emejuo; Onyeisi ọchịchị obodo Eziagu, Maazị Chukwuma Obi; Onyeisi ọchịchị obodo Ezira, Maazị Moses Akam; tinyere ụkọchukwu nọ n’isi Ezira Ashdikinri, bụ Kamtoochukwu Obi; na ụkọchukwu nọ n’ụlọụka ‘St. Matthew’s Parish, Eziagu’, bụ ụkọchukwu Ebenezer Okpalotubelu.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere Maazị Nnamdi Eze; nwunye Ashbishọp Mpaghara Niger n’oge mbụ, bụ Oriakụ Eugenia Okpara; nwunye Onyeisiala Nigeria n’oge mbụ, bụ Oriakụ Ifeoma Ekwueme, na ụfọdụ ndị ọzọ, ndị tinyekwara olu wee dụọ ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha na-azụlite ụmụ ha n’egwu Chineke, na-atụkwasị obi na Chineke oge niile ma werekwa ihe niile ha mụtara ebe ahụ mere ihe.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles