28.2 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

N’Obosi, A Kpọchisiela Ụlọọrụ Ji Gọọmenti Ụgwọ, Jide Ndị Ọna Ụtụ Iwu Akwadòghị̀

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ego a na-enwete n’ime steeti Anambra, bụ ụlọọrụ ‘Anambra State Internal Revenue Service (AIRS) akpọchiela ụfọdụ ụlọọrụ na ụlọahịa dị icheiche ji gọọmenti steeti ahụ ụgwọ na ndị anaghị akwụ gọọmenti ụtụ isi ha kwesiri ịdị na-akwụ.

Ụlọahịa ahụ na ụlọọrụ ahụ bụgasị ndị dị na mpaghara Obosi na gburugburu ya, bụkwa gburugburu ebe a nọrọ nwụchikọ́ọ́ ndị ọna ụtụ dị icheiche iwu akwadòghị̀.

Ụfọdụ ndị ahụ e jidere na-anakọsị ego n’aha gọọmenti ka e kwuru na ọ bụ ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti dunyere ha ọrụ ọjọọ ahụ, bụkwa ndị a na-eme nnyocha ugbua, iji chọpụta ma nwụchikọ́ọ́ ha.

Onye duru ndị ọrụ ‘Anambra State Internal Revenue Service’ wee bagidere n’ịnwụchikọ ndị omekome ahụ na ịkpọchisi ụlọọrụ ahụ, bụ Dọkịta Christian Madubuko kwùrù na ha agaghị ada n’ọrụ ibu agha megide ndị ọna ụtụ iwu akwadòghị̀ na steeti ahụ.

Ọ gbarụ̀rụ̀ ihu na ụfọdụ ndị ahụ etu ụfọdụ ndị ọna ụtụ gọọmenti sikwazị etinye aka n’izufùsì ego gọọmenti, n’ihi oke ọchịchọ nke onwe, ọbụna dịka o fooro ntutu taa, sị na ụlọọrụ ya agaghị ala azụ n’ibu agha megide nke ahụ.

N’okwu ha n’otu n’otu oge a gbara ha ajụjụọnụ, ndị ọnụ ụtụ ahụ e jidere, nke gụnyere Maazị Adimchukwu Onyema na Emeka Ojukwu kwùrù n’eziokwu na ha na-anakọsị ndị mmadụ ụtụ isi ha n’aha gọọmenti, ma kwuo na ọ bụ ụfọdụ ndị òtù ‘Anambra State Joint Enforcement Team (ANJET)’ dunyere ha ọrụ ahụ. Ha kwukwara na ha na-akwụ ndị ahụ dunyere ha ọrụ ahụ ego ruru puku naịra iri atọ maọbụ puku naịra iri anọ n’otu n’otu kwà ụbọchị, dabere n’etu ọrụ siri dị ụbọchị ahụ.

Ndị ahụ bụkwazị ndị a na-atụ anya na a ga-akpụpụ̀ ha ụlọikpe ma e mechaa nnyocha, iji were usoro iwu lee ha ọrụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles