23.2 C
Nigeria
Monday, May 20, 2024

N’Anambra, Ndị Nnobi Eguzobela Otu Ọrụ Nchekwa Ọhụrụ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị obodo Nnobi dị n’okpuruọchịchị Idemili South nke steeti Anambra eguzobela otu ọrụ nchekwa ọhụrụ, iji memilaa nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa na ndị omekome n’obodo ahụ, gburugburu ya, na steeti Anambra n’izugbe.

Ndị ọrụ nchekwa ahụ bụ ndị ga-ejikọ aka ọnụ, ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ọkachasị dịka o siri metụta inwete ozi, ịnwụchikọ ndị omekome, na inyefe ha n’aka ndị uweojii.

N’okwu ya na mmemme e jiri gbape nguzobe ndị ọrụ nchekwa ahụ, eze ọdịnala obodo Nnobi, bụ Igwe Nick Obi, onye gbapere ya bụ atụmatụ ọrụ nchekwa, kọwara na ebumnobi nke ahụ bụ iji chụọ mpụ na arụrụala ọsọ ụkwụ eru ala ma memilaa aka ọrụ ndị omekome na Nnobi.

Igwe Obi, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ Onowu obodo ahụ, Chiifu Onyechi Ifejuee kpere ekpere maka ezi nchekwa ndụ na akụnụba, na ọdịmma nke ụmụafọ Nnobi, obodo Nnobi, na n’ala Nigeria n’izugbe.

A ntụnye nke ya, Onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Ọkaiwu Dominic Okpala chetere mkpamkpa dị icheiche ndị omekome kpagoro n’obodo ahụ n’oge gara aga, ma kwupụta olileanya o nwere na mgbape ahụ a gbapere otu ọrụ nchekwa ọhụrụ ahụ ga-enye aka ịgbanwe akụkọ ahụ.

Ọ dọ̀kwazị̀rị̀ ndị omekome dị icheiche na-etinye aka na mpụ na arụrụala n’obodo ahụ ka ha sepu aka na nke ahụ, maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ n’obodo ahụ, maka ndụ ha, n’ihi na ndị ọrụ nchekwa ahụ agaghị ada mbà ịnwụchikọ onye ọbụla tinyere aka n’ihe ọbụla nwere ike ibute ala adịghị mma n’obodo ahụ maọbụ na gburugburu ya.

Na ntụnye nke ha n’otu n’otu, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ Chukwuma Soludo n’ihe gbasara nkwalite ndị ntorobịa, bụ Dọkịta Nelson Omenugha, na nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n’ihe gbasara nchekwa obodo, bụ Maazị John-Chris Chigbo kèlèrè ndị Nnobi na ndị ndu obodo ahụ maka iguzobe otu ahụ.

Ha mèrè ka a mara na ọrụ nchekwa so n’ihe mbụ ọchịchị Gọvanọ Soludo na-etinye uchu na ya, n’ihi oke mkpa ọ; ọbụna dịka o kwèrè nkwà na gọọmenti ga-aga n’ihu inye ha nkwàdó zuru oke.

N’okwu nke ya, Onyeisioche òtù ọrụ nchekwa ọhụrụ ahụ, bụ Maazị Chinedu Nnobi kwèrè nkwà ịrụ ọrụ ha nke ọma ma rụkwa ya n’ikwesi ntụkwasịobi nà n’ịgbaso usoro iwu na-achị ọrụ ha, ọbụna dịka ha rịọkwazịrị nkwàdó ọhaneze na ụmụafọ obodo ahụ iji rụọ ọrụ ha etu o kwesiri.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles