32.5 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

E jidela Ndị Na-amanye Obere Ụmụaka Ịgba Akwụna n’Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii akparala ụmụnwaanyị nwe ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị n’Amawbia, n’okpuruọchịchị ime obodo Awka South nke steeti Anambra, maka etu ha si amanye obere ụmụaka nwaanyị na ụfọdụ ụmụagbọghọbịa ndị ọzọ iji ahụ ha akpara ya ego (ịgba akwụna) n’ogige ebe ahụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu bụ ya kwupụ̀tàrà nke a n’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ụfọdụ n’ime ụmụaka ahụ nwaanyị ahụ manyere ịgba akwụna n’ogige ya bụ ndị dị naanị afọ iri na ise, ma bụrụkwa ndị etozubeghị òkè ime ihe dị etu ahụ. O mere ka a mara na a zọpụtala ụmụagbọghọbịa niile ahụ oge ha wakporo ebe ogige ụlọ oriri na ọṅụṅụ ahụ.

DSP Ikenga kwuru na ọ bụ ndị uweojii steeti ahụ na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze na steeti Anambra bagidere na ya bụ ọrụ ịnapụ̀tà ndị ahụ, ma kọwakwa na ha mere nke ahụ oge ha nwetechara ozi banyere ihe na-aga ebe ahụ.

O mere ka a mara na ụmụaka niile ahụ a zọpụtara ebe ahụ bụcha ndị e siri steeti Ebonyi wee kpọta ma bụrụkwa ndị e kwere nkwa na a ga-enye ha ọrụ ebe ha ga na-ere ihe ma ha biaruo; e wee jirizie ha mere óhù ịgba akwụna n’ebe ahụ.

N’ajụjụọnụ a gbara ha, ụfọdụ n’ime ụmụaka ụmụnwaanyị ahụ kwuru na ọ bụ ọgwụ ka ndị kpọtara ha Anambra mere ha n’Ebonyi, ha wee sorozie ha bịa. Ha kwuru na oge ụmụnwaanyị abụọ, bụ Chika na Ifeoma bịara be ha n’Ebonyi ahụ wee gwachaa ha na ha nwere ọrụ ha ga-enye ha n’Anambra, na ha ekweteghị ịga n’ihi na Anambra tere aka, tupu ụmụnwaanyị ahụ wee pụọ, chighata ọzọ, ma kụọ ha ọgwụ, uche ha wee pụọ, nke na ha aghọtaghịzị onwe ha, ma na-ekwetezị ihe ọbụla ụmụnwaanyị ahụ kwuru, wee soro ha pụọ.

Ha sịkwa na ụmụnwaanyị ahụ narasị̀rị̀ ha ekwentị ha ma gbanyụọ ha oge ndị be ha malitere chọba ma na-akpọ ha n’ekwentị. Ha kwukwara na ọ bụ na be ụmụnwaanyị ahụ n’Ebonyi ka ha rahụrụ n’abalị ahụ, n’ihi na chi ejibela, nke na ha enweghịzị ike ibịanwu Anambra ụbọchị ahụ.

Dịka ha siri kọwaa, mgbe ha ruru Anambra n’echi ya, ụmụnwaanyị ahụ kpọnyèrè ha otu nwaanyị a na-akpọ Ezenwaanyị n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị n’Amawbia. Ha kwuru na ka nke ahụ mechara, na ha malitere nwetebe onwe ha obere obere, wee malitezie ịjụ ajụjụ banyere ebe ha nọ, etu ha siri bịaruo ebe ahụ, nà ihe ha na-eme ebe ahụ. Ha kọ̀wàrà na o nweghị onye n’ime ụmụnwaanyị ahụ kwere agwa ha ihe ọbụla, ma ya fọ̀dụzie ịza ha ajụjụ niile ahụ ha na-ajụ oge ọgwụ ahụ pụ̀sị̀latara ha n’anya.

Ha kwuru na ọ bụ nke ahụ mezịrị ha jiri bebe akwa, kwube na ha chọrọ ịlaghachi azụ be nna ha n’Ebonyi; mana Ezenwaanyị ahụ kwechiiri, sị ha na o nweghị ebe ha na-aga. Ha sị na ya bụ Ezenwaanyị gwara ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ịlaghachi azụ be nna ha, ha amara na onye ọbụla n’ime ha ga-akwụ ya otu narị puku na iri ise (₦150,000), maọbụ ha anọrọzie ebe ahụ gbabara ya akwụna ma jeere ya ozi otu afọ tupu ọ hapụ ha ka ha laba.

Na nchịkọta okwu ha, ha kwụzịrị na ọ bụ etu ahụ ka e siri nakọrọsịa ha ihe niile ha jiri bịa, wee manye ha ịgba akwụna na iji ahụ ha kpatara Ezenwaanyị ego.

Ụmụaka ahụ kọwara na Ezenwaanyị gwara ha na ha ga na-agbatara ya bido puku naịra iri ruo puku naịra iri na ise (₦10,000 – ₦15,000) kwà ụbọchị ọbụla, ma na-agbatara ya puku naịra iri anọ (₦40,000) ụbọchị ụka ọbụla n’ihi na ọ bụ ụbọchị ahụ ka ọrụ kà adị. Ha sịkwa na ọ bụ naanị otu puku naịra (₦1000) ka umunwoke na-akwụ ha oge ọbụla e riri ha ọkọmbọ, belụsọ ma onye ahụ o riri ugboro abụọ maọbụ karịa. Ha kwukwazị̀rị̀ na ha na Ezenwaanyị na-enwekarị okwu, ebe ọ na-enyekwa onye ọbụla n’ime ntaramahụhụ kwà ụbọchị ọbụla onye ahụ arụtàzùghị̀ ego ole ọ na-atụ anya n’aka ha.

Dịka ha siri kwuo, Ezenwaanyị na-etinyekwara ha anya nke ọma ma na-aṅa ntị oge ọbụla ha na mmadụ na-akparịta ụka, iji hụ na ha akọtaraghị mmadụ ọbụla ọnọdụ ha ebe ahụ. Ha sị na ọ naghị ekwekwa ka ha pụọ apụọ.

Banyere etu e siri mechaa zọpụta ha, ha bụ ụmụaka ụmụnwaanyị kwukwazị̀rị̀ na ọ bụ otu onye n’ime ha jiri ekwentị onye bịara pịa ya ọkụ wee kpọọ ndị be ya n’Ebonyi, gwa ha ebe ha nọ nà ọnọdụ ha nọ n’ime ya. Ha sịkwazị̀ na oge onye ahụ pụrụ, ya na ndị be ha kpara nkị̀tà wee kpọtụrụ Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ify Obinabo; ya onwe ya wee kpọọ ndị uweojii, ha niile wee wụchie ebe ahụ n’ụtụtụ ụbọchị Mọnde, wee zọpụta ha na ụmụagbọghọbịa ndị ọzọ jikwa ụkwụ ha akpa ego ebe ahụ, ma nwụchikọkwa Ezenwaanyị na ụfọdụ ndị ọrụ ya.

N’okwu ya banyere nke ahụ, Kọmishọna Obinabo katọ̀rọ̀ kpamkpam, ihe ọbụla bụ imegbu mmadụ, iji mmadụ akpa ego, maọbụ ịtụ mgbere mmadụ na Steeti ahụ. Ọ dụ̀kwara ndị niile na-etinye aka n’ihe ọbụla dị etu ahụ maọbụ ihe ndị ọzọ iwu akwadòghị̀ ka ha sepu aka ha maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ na steeti ahụ kpamkpam.

Ya bụ Kọmishọna, onye nyekwara nkọwa banyere etu ha siri gaa ya bụ ọrụ, mèrè ka a mara na okwu ahụ eruolarị Gọvanọ Chukwuma Soludo ntị. O kwuru na a kpọrọla ụmụaka ahụ gaa ụlọọgwụ maka ilekọta ahụike ha, ma sị na okwu ahụ dịkwazị̀ n’aka ngalaba ‘State Criminal Investigation Department (SCID)’ nke ndị uweojii Anambra ugbua; ọbụna dịka o mere ka a mara na ga-akpụpụ̀ Ezenwaanyị ahụ na ndị òtù ya ụlọikpe ngwangwa e mèchàrà nnyocha banyere arụrụala ha n’oge adịghị anya.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles