24.4 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

Ndị Gọọmenti Etiti Zitere Agaala Njem Nleta n’Ebe Mbize Na-enye Nsogbu n’Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụfọdụ ndị gọọmenti etiti zitere ịbịa mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ nnukwu mbize bidoro inye ajọ nsogbu na steeti ahụ na nsonso a, bụ nke dị na mpaghara Oba, n’ogologo ụzọ awara-awara ahụ siri Onitsha gaa Onitsha.

Njem nleta ahụ bụ nke ụlọọrụ ‘Ecological Project Office’ dị n’okpuru ụlọọrụ Odeakwụkwọ Izugbe Gọọmenti Etiti nọ n’isi ya. E dugharịkwara ha na mpaghara ebe ndị ọzọ mbize na-enye nsogbu na steeti ahụ.

Ọ bụkwa Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na steeti Anambra, bụ Injinia Felix Odimegwu nà ndị sitere ụlọọrụ ‘Anambra State Erosion, Watershed and Climate Change Agency (ANSWECCA)’ dugharịrị ndị ahụ.

Ụfọdụ ebe ndị ọzọ dị icheiche mbize na-enye nsogbu ga gara gụnyere mpaghara ‘Royal Estate Ububa Village’ dị na Nkpor, nke dị n’ogologo ụzọ Ozubulu-Ekwusigo-Umudike Ukpor, okporoụzọ siri Ukpor gaa Nnewi, nke dị n’Awor-Ezimuzor n’Ezinifite, nke dị n’Amichi, na ụfọdụ ebe ndị ọzọ.

N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ ka ha gachara njem nleta ahụ, Onyeisi otu ahụ gọọmenti etiti zitere, bụ Injinia Lawal Mohammed kwuru na ha bịara ka ha wee jiri anya ha hụ ka ọnọdụ siri dị n’ebe ndị ahụ mbize na-eme mkpamkpa, wee marakwa ụzọ gọọmenti etiti ga-esi gbata ọsọ enyemaka.

O kwukwazị̀rị̀ na ha ga-akọrọ ndị ziri ha ọrụ etu ha siri gaa na ihe ha hụrụ n’ebe dị icheiche ha gara; ọbụna dịka o kwèrè nkwà na gọọmenti etiti ga-agbata ọsọ enyemaka n’oge adịghị anya n’ebe ndị ahụ.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu, bụ Injinia Odimegwu kwùrù na steeti Anambra bụ steeti kachara nwee ọnụọgụgụ ebe mbize na-enye nsogbu n’ala Nigeria.

Ọ kpọpụ̀tàsị̀rị̀ mbọ dị icheiche gọọmenti steeti ahụ gbagoro iji gbochie mkpamkpa ahụ mbize ahụ na-akpa ma gbochie ya ikawanye njọ.

Dịka ọ na-ekele gọọmenti etiti maka nzọpụ ụkwụ ya n’ọnọdụ ahụ site n’izite ndị ahụ bịara ya bụ njem nleta; Kọmishọna Odimegwu tinyekwàrà ọnụ wee rịọ gọọmenti etiti ọzọ ka ọ rụruo ya bụ ọrụ ọ malitegoro n’isi.

Ụfọdụ ndị bi na gburugburu ebe mbize na-enye nsogbu, nke gụnyere Ifeanyi Iloegbunam na ijeoma Uzor kelere gọọmenti steeti ahụ maka mbọ ọ gbagoro, ma rịọkwa gọọmenti etiti ka o mee ihe banyere ebe ahụ tupu ya bụ ajọ ọnọdụ agaa n’ihu na-akawanye njọ, maọbụ taa isi mmadụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles