25.2 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

Soludo Etoola Emeka Offor Maka Ntụnye Ya n’Ịkwalite Mmepe ObodoSoludo Etoola Emeka Offor Maka Ntụnye Ya n’Ịkwalite Mmepe Obodo

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo etoola onyeisi otu ‘Sir Emeka Offor Foundation (SEOF)’, bụ Maazị Emeka Offor màkà mmasị ya nà ntụnye dị icheiche ọ na-eme n’ịkwalite mmepe obodo nà n’ịkwàlite ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ.

Gọvanọ Soludo kwupụ̀tàrà nke a oge ọ gara ileta ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ Maazị Offor rụrụ ụlọọrụ Katzec Engineering Limited, dị na mpaghara Ilashe land, Snake Island nke steeti Lagos. Ya bụ ọrụ bụ nke e jiri ijeri kwuru ijeri naịra wee rụọ, ma bụrụkwa nke anaghị arụzị ọrụ ugbua.

N’okwu ya oge ọ na-edugharị Gọvanọ Soludo n’ogige ụlọọrụ ahụ, Maazị Offor nyèrè nkọwa banyere ụlọọrụ na ụdị akụrụngwa ọ̀pụrụiche e jiri rụọ ya kemgbe ọtụtụ afọ gara aga.

O mere ka a mara na ọ bụ n’afọ 2010 ka o guzobere ya bụ ụlọọrụ dịka ụlọọrụ pụrụ iche na ngalaba ihe gbasara mmepụta na ọrụ mmanụ na ikuku n’ala Nigeria, ya na ịrụ okporo mmanụ. O kwuru na ọ bụ naanị afọ ise ka ụlọọrụ ahụ rụrụ ọrụ, wee mechie kemgbe afọ 2015 wee ruo taa, n’ihi ike na mmekpaahụ sị n’aka gọọmenti.

O kwukwazịrị na tupu ya bụ ụlọọrụ ebidokwa rụba ọrụ ọzọ, na ọ ga-ewe enyemaka na ntụnye gọọmenti etiti na gọọmenti steeti, bụkwa nke o kwuru na ọ dị nnukwu mkpa n’ihi ụdị ọkpụrụkpụ ego na ọkpọkọ̀pị́ akụrụngwa e jiri rụọ ya bụ ụlọọrụ, bụkwa nke nọzị ebe ahụ wee na-ala n’iyi.

Na nzaghachi ya, Gọvanọ Soludo kwupụ̀tàrà obi mwute ya banyere ọnọdụ ụlọọrụ ahụ ugbua, ọbụna dịka o siri metụta ego nwa mmadụ liri n’ala ebe ahụ iji guzobe ya bụ ụlọọrụ.

Dịka ọ na-ekwe nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n’ịkwàlite ọnọdụ mmepe; ya bụ Gọvanọ kelekwazị̀rị̀ Maazị Offor màkà ụzọ dị icheiche o sigoro gosipụta mmasị ya mekwa ntụnye n’ịkwalite mmepe obodo nà ime ka ihe dịrị ụmụ mmadụ mfe.

Ụfọdụ ndị Kọmishọna na ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n’ọchịchị steeti Anambra sonyèkwara na njem nleta ahụ, tinyere ụfọdụ ndị nlekọta ụlọọrụ ahụ na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba ewumewu ụlọọrụ nà mmepụta ngwaahịa na steeti Lagos.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles