21.2 C
Nigeria
Saturday, July 27, 2024

N’Anambra, Ndị Umunze Akpụọla Arụsị Asatọ Maka Mpụ na Arụrụala

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ anụ gbaa ajọ, ọsọ a gbanyere ya ajọ egbe, maka na ọ na-abụ anụ febe ebeghị ebe, dinta agbaba atụghịa atụ.

Ka ọ dị taa, ndị obodo Umunze, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Orumba South, nke steeti Anambra ejirila otu olu kwekọrịta ma kpụọ arụsị megide mpụ na arụrụala na ajọ ihe ndị ọzọ dị icheiche na-eme na mpaghara ahụ na gburugburu ya, ọkachasị mkpamkpa ndị ojiegbe na-akpa, igbu ọchụ̀, ịtọrọ mmadụ, na ụdị arụrụala ndị ọzọ.

Ịkpụ arụsị ahụ bụ nke e mere na nsonso a, ma bụrụkwa nke gbásàrà ka ụkpaka n’onyoonyoo, site n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, ebe a hụrụ ndị obodo ahụ ka ha nupụtara n’ìgwè wee sonye na ya, ma ụmụnwoke, ụmụnwaanyị, ndị ntorobịa, na ndị dibia na eze nwaanyị dị icheiche nọ n’obodo ahụ.

Ndị ahụ kpụrụ arụsị asatọ dị n’Umunze, nke gụnyere Izo, Ngene, Ajala, na ndị ọzọ, bụkwa nke ha mere na Mbara Izo Umunze. Ka ha na-akpụ ya bụ arụsị, ha na-ekwubikwa okwu ma na-ezipukwa abụmọnụ dị icheiche megide onye ọbụla ọzọ nwara anwa soro gbaa izu maọbụ tinye aka n’ime ihe ọbụla bụ mpụ na arụrụala n’obodo ahụ, ọbụladị dịka ha na-akpọkukwa arụsị asatọ ahụ ka ha buso onye dị etu aghụ agha ma memilakwa ya ma na mmụọ ma na mmadụ.

N’okwu ha n’otu n’otu banyere nke ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe P. N Eze, na onye ji ọkwa ugbua dịka onyeisi ọchịchị obodo Umunze, bụ Hypolite Uchechukeu Olua kwuru na o teela obodo ahụ jiri busobe ajọ ọnọdụ nchekwa agha, ma kwukwa na ala Umunze dị ọkụ ugbua megide ndị na-etinye aka na mpụ na arụrụala n’obodo ahụ, bụ ndị ha kwuru na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị mba. Ha kwukwara na ọkụ ka ọkụ nà ághá ime mmụọ ka na-abịakwa n’ihu ugbua ịdakwàsị ndị ọbụla na-eme maọbụ na-akwàdó mpụ na arụrụala n’obodo ahụ, n’agbanyèghị onye ebe onye ahụ bụ, maọbụ obodo o si.

Ha gakwara n’ihu kwuo na arụsị niile ahụ ebidola ọrụ ozigbo ibu agha megide ịtọrọ mmadụ, igbu ọchụ, mkpamkpa ndị ojiegbe, bụ nke ọtụtụ ndị na-eme ha gbagokwara ọsọ ugbua pụọ n’obodo ahụ, ma sịkwa na ozu ka ozu ka ga-ada oge adịghị anya ma ọ bụrụ na ndị na-eme ihe dị otu ahụ n’obodo ahụ esepụghị aka na ha maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ n’Umunze.

Ọ dị ncheta na kemgbe ahụ ndị ojiegbe wakpòchara ndị ọrụ nchekwa n’ọnwa Septemba afọ gara aga n’Umunze, mpụ na arụrụala dị icheiche gàrà n’ihu na-arị ibe ya elu n’obodo ahụ, bụkwazị nke mere ndị obodo ahụ jiri kpebie ma were otu olu kwekọrịta maka ịkpụ arụsị ahụ, maka na mmadụ agaghị anọkwa be ya nọpịara mkpụrụ amụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles