28.2 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

Ụwa Bụ Ofu Mbịa

 

Izunna Okafor dere abụ a

Mkpesa karịrị
Nsogbu dị̀kwà ọtụtụ
Mana ndụ̀ dị̀ naanị ofu
Maka na ụwa bụ ofu mbịa.

Ụtụtụ, ehihie, abalị
Ezumike adịghị
N’ihi nchekasị na ịchụ ihe nke ụwa
Ị̀ màkwà na ụwa bụ ofu mbịa?

Gidim gwom! Gidim gwom!!
Gịnị ka a na-achụdị ihe a?
Ole ka ị chụtagoro? Ole fọrọ afọ?
Nwoke m jirikwanụ ya nwayọ
Maka na ụwa bụ ofu mbịa.

Leruo ndụ gị anya, ị sị mba
Belụsọ̀ mgbe ọrịa pịatuoro gị
Ị chọba onye ị ga-asị na-egbu gị
Wee chezọọ na ojiọsọ ga-adarịrị otu ụbọchị
Nwoke m, ụwa bụkwa ofu mbịa.

Pụta ụwa mgbede, i kwechiri
Chébé ụbọchị a ga-akwa ozu n’ụmụnna gị
Ka i wee ṅụọ mmanya awuufu n’isi ndị na-eru uju
Ma ọ bụrụkwa na ịchụ ego kwere gị gaa agaa
Ọga, ụwa bụkwanụ ofu mbịa.

Nyere mmadụ ibe gị aka, ị jụ
Sị na nke ị chụtara ezubereghị̀ gị
Ị̀ ga-ebudị ego ụwa laa mmụọ?
Ị makwa na ụwa bụ ofu mbịa?

Nwanne m, nsogbu ụwa anaghị agwụ agwụ
Akụ nke ụwa anaghị ejukwa afọ
Jirigodi nke ị chụtara nyejuo onwe gị afọ
Maka na ọ bụ nke onye riri ka o bu ala mmụọ
Tinyere na o nweghị onye ma mgbe ekwe ga-akpọ ya.

Onye laa na-erighị
Ndị nọ ndụ erichitere ya
Maka na akpịrị anaghị ajụ ụtara
A chọọ ènwè, a hụghị
Edi na ụmụnne ya erie ya ekpe.

Ihe ụwa anaghị agwụ agwụ
Ihe ụwa bụ onye mere ike ya…
Ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya, ọ laa
Maka gịnị?
Maka na ụwa bụ ofu mbịa!

© Izunna Okafor, 2024

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles