24.4 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

Soludo Arụọrọla Ndị Ọrụ Oyibo Mmiri Ji Ike Si n’Anyanwụ Arụ Ọrụ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onyeisi ọrụ oyibo na Steeti Anambra bụ Ọkaiwu Theodora Igwegbe etoola aka na-achị steeti ahụ bụ Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo maka ntụnye ya n’ịkwalite ọdịmma ndị ọrụ obodo na ọnọdụ obibindụ ha na steeti ahụ.

Ọkaiwu Igwegbe nyere ekele a mgbe ọ gara ileta ebe ọchịchị steeti ahụ dozigharịrị akụrụngwa mmiri anaghị arụzị ọrụ ma rụgharịkwa ya ọ bụrụzie nke ga-eji ike si n’anyaanwụ arụ ọrụ, n’ebe obibi ndị ọrụ oyibo steeti ahụ dị n’Iyiagu, Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.

 

Ya bụ njem nleta ọrụ bụ nke Ọkaiwu Igwegbe mere site njikọaka Kọmishọna na-ahụ maka Ọkụ na Mmiri na steeti Anambra, bụ Maazị Julius Chukwuemeka, bụ onye ụlọọrụ ya rụrụ ya bụ ọrụ. Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka Omenala na Njem Nlegharịanya, bụ Maazị Don Onyenji, bụ onye bikwa n’ebe ahụ a rụrụ ya bụ ọrụ, na ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n’ọrụ oyibo na ndị bi ebe ahụ nọ̀kwà na ya bụ mmemme.

N’okwu ya mgbe o letechara ka ọrụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ, Ọkaiwu Igwegbe kọwapụtara ụfọdụ ụzọ dị icheiche Gọvanọ sigoro kwàdó ma gosipụta mmasị n’ịkwàlite ọdịmma ndị ọrụ oyibo steeti ahụ. Ọ jara ya ike maka nkwàdó nrụzigharị mmiri ahụ, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka n’ụzọ pụrụ iche iweta n’isi njedebe, nsogbu ụkọ mmiri ndị ọrụ oyibo ahụ na ndị ọzọ bi na gburugburu ebe ahụ na-enwe.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka Ọkụ na Mmiri, Injinia Chukwuemeka kwuru na nrụzigharị a rụzigharịrị mmiri ahụ na mgbanwe ahụ a gbanwere akụrụngwa ahụ ka o jirizie ike si n’anyaanwụ wee na-arụ ọrụ bụ otu n’ime ọtụtụ ebe ndị ọzọ gọọmentị steeti ahụ rụgoro ụdị ọrụ dị etu ahụ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ na nsonso. O kwuru na ụfọdụ ebe ndị ọzọ gọọmenti rụgoro ụdị ọrụ ahụ gụnyere nke ha rụrụ n’Iyiora, Anam, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Anambra West; nke ha rụrụ n’obodo Ibuhugu dị n’Umuchu, n’okpuruọchịchị Aguata, na ebe ndị ọzọ.

Ọ kọrọ akụkọ na nnyocha ụlọọrụ ya mere oge ọ malitere ọrụ ọhụrụ gosiri na ihe karịrị pasentị iri asaa mmiri gọọmenti gbapuru na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ anaghị arụzị ọrụ etu o kwesiri n’ihi enweghị ọkụ latirik maọbụ ego mmanụ ọkụ dịzel, bụ nke mezịrị ha jiri kpebie ịrụgharịsị ha na itinye akụrụngwa ọgbaraọhụrụ na ha, ka ha jirizie ike si n’anyaanwụ wee na-arụ ọrụ. O kelekwara Gọvanọ Soludo maka nkwàdó ya nye minịstịrị ya n’ọrụ dị icheiche ha na-arụ.

Dịka ọ na-agba akaebe na atụmatụ ọhụrụ ahụ ga-enye aka n’ụzọ pụrụ iche n’ichekwa na ịkwàlìtè ezi ọnọdụ gburugburu na ihu igwe; Kọmishọna Chukwuemeka kwukwazị̀rị̀ na ya bụ atụmatụ ga-enyekwa aka n’ụzọ pụtara ìhè n’imezùpụ̀tà ebumnobi ahụ Gọvanọ Soludo nwèrè ime Anambra steeti ka ọ chawapụ, na-agawanye n’ihu ma dịkwa mma obibi.

N’okwu ha n’otu n’otu, ụfọdụ ndị bi n’ebe ahụ, nke gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka Omenala na Njem Nlegharịanya, bụ Maazị Onyenji, na Onyeisioche ogige ahụ, bụ Maazị Obi Anthony Okechukwu, kọwapụtara ihe dị icheiche ha gabigara n’oge gara aga mgbe mmiri ahụ ji igwe na-enye ọkụ were arụ ọrụ. Ha kọwapụ̀takwàrà ọtụtụ mbọ dị icheiche ha gbara iji dọta gọọmentị steeti ahụ ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka, bụ nke amịtaghị mkpụrụ ọbụla, wee ruo mgbe gọọmentị Soludo batara n’ọchịchị wee gbatara ha ọsọ enyemaka ngwangwa.

Ka ha na-aja Gọvanọ ahụ ike maka mgbataọsọ ya n’ọnọdụ ha ahụ, ndị ahụ gbakwara akaebe na mmiri na-agbazị n’ime ụlọ ha ugbua. Ha kwèrè nkwà ịga n’ihu na-enye ọchịchị ya nkwàdo zuru okè.

Ha kelekwara Kọmishọna Chukwuemeka na Onyeisioche ọrụ oyibo steeti ahụ, Okaiwuy Igwegbe maka mbọ ha gbara iji hụ na e gbooro ha mkpa ahụ, ọbụna dịka ha kwere nkwà ichekwa na ilekọta ya bụ mmiri na akụrụngwa dị ebe ahụ anya nke ọma.

Ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ gụnyere ndị selitere isi n’ọrụ oyibo steeti ahụ, nke gụnyere Maazị Adebayo Ojeyinka; Oriakụ Ifeyinwa Uzoka; Maazị Victor Ezekwo, na ụfọdụ ndị ọzọ. Ụfọdụ ndị ọzọ bikwa n’ogige ahụ sonyèkwara na ya bụ mmemme iji gbaa akaebe banyere ya bụ ọrụ a rụụrụ ha.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles