25.9 C
Nigeria
Friday, May 10, 2024

Ndị Umuona Echiela Igwe Ọhụrụ Ka A Chụtùchara Ejesieme n’Ocheeze

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ eze pụọ, eze anọchie.

N’ịgbaso nke a, ndị obodo Umuona dị n’okpuruọchịchị ime obodo Aguata na steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee chie ma guzobe Igwe Sunday Ezeofor n’oche dịka eze ọdịnala ọhụrụ nke obodo ahụ.

Ya bụ mmemme nguzobe n’ọkwa bụ nke mere ka ọ gachara ọnwa olenole gọọmenti steeti Anambra jiri chụtuo Maazị Humphrey Ejesieme n’ọkwa dịka eze ọdịnala obodo ahụ, n’ihi ihe dị icheiche o mere na nke o meghị oge ọ nọ n’ọkwa.

N’okwu ya n’ebe ahụ, onyeisi ọchịchị Umuona Progressive Union, bụ Maazị Kenneth Okoli kèlèrè Gọvanọ Chukwuma Soludo na ọchịchị steeti ahụ maka mgbataọsọ ha na nkwàdó dị icheiche ha na-enye obodo ahụ, iji hụ na ihe na-aga etu o kwesiri. O kelekwara Kọmishọna na-ahụ maka Ọchịchị Ime Obodo na Echichi Ọdịnala, bụ Maazị Tony-Collins Nwabunwanne maka nkwàdó ya.

Ọ kọ̀wàrà Umuona dịka obodo hụrụ udo na idinotu n’anya, ma kelee gọọmenti maka ime ka udo tọrọ atọ laghachi n’obodo ahụ ọzọ ka e nwechara obere nsogbu banyere ọchịchị obodo ahụ. O kwezịrị nkwà na ndị Umuona ga-aga n’ihu inye gọọmenti steeti ahụ nkwàdó zuru okè, ma na-atụnyekwa ụtụ dịka obodo n’Ịkwàlite ọdịmma steeti ahụ, iji mezupụ̀ta ebumnobi ahụ Gọvanọ Soludo nwere ime ka ya bụ steeti chawapụ, na-agawanye n’ihu, ma dịkwa mma obibi.

N’okwu nke ya oge e guzobechara ya n’ọkwa, Igwe Ezeofor kèlèrè ndị Umuona maka ịhụta ya dịka ndị tozuru okè ịbụ eze ọdịnala ha, ma kwuo na ọ gaghị agharịpụ ha, n’ihi na ọ ga-eji ọkwa ọhụrụ ahụ wee rụọ ọrụ iji wulite ọdịmma na mmepe obodo ahụ, ya na iji mee ka ya bụ udo tọrọ atọ dị n’obodo ahụ dị ọkpụtọrọkpụ.

Ya bụ eze ọdịnala ọhụrụ rịọrọ ụmụafọ obodo ahụ ka ha gbaghara ihe mere n’oge mbụ ma gbasoo ụzọ udo, iji weta mmepe n’obodo ahụ. O kelekwazị̀rị̀ Gọvanọ Soludo maka ọrụ mmepe dị icheiche ọ na-arụ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, ma kwe nkwà na ha ga-aga n’ihu inye ọchịchị ya nkwàdo.

Mmemme ahụ dọtakwara ọtụtụ ndị obodo ahụ na ụfọdụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles