35.5 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

CP Adeoye Ebidola Ọrụ n’Anambra, Kelee Soludo, Dọọ Ndị Omekome Aka Na Ntị

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nwa amadi ahụ a kpọlitere n’ọkwa dịka onyeisi uweojii ọhụrụ na steeti Anambra, bụ CP Aderemi Adeoye amalitela ọrụ n’uju na steeti ahụ.

Ọ dị ncheta na CP Aderemi bụ onye a kpọlitere ọhụrụ n’ọkwa ahụ na nsonso a, ma ọ malitere ọrụ ụbọchị Mọnde, abalị iri  nke ọnwa Julaị dịka onye nke iri atọ na atọ bụgoro Kọmishọna ndị uweojii na steeti Anambra. Ọ gakwara ụbọchị ahụ gaa zute aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo n’obi gọọmenti dị n’Awka, bụ ebe Osote Gọvanọ, Dọkịta Onyekachukwu Ibezim nabatara ya n’aha Gọvanọ.

N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n’isi ụlọọrụ ya dị n’Amawbia ụbọchị Wenezdee, CP Adeoye kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe dị icheiche kacha echere ọnọdụ nchekwa aka mgba na steeti ahụ, nke gụnyere ohi, ịtọrọ mmadụ, otu nzuzo, ịma aka akpà, nsogbu onye apụ̀takwala iro (sit-at-home), tinyere nsogbo ndị ọzọ, ma mee ka a mara na ụlọọrụ uweojii steeti ahụ ga-aga n’ihu ịrụsi ọrụ ike n’agha ahụ a na-ebu megide mpụ na arụrụala n’ime steeti ahụ.

O kwuru na ọ ga-amàlite ebe onye nke pụrụ apụ rụdobere, ma welitekwuorị aka n’ọrụ ime ka steeti ahụ gaa n’ihu ịnọ n’ọnọdụ ịbụ steeti kachara nwee ezi nchekwa n’ala Nigeria. Ọ sịkwa na ụlọọrụ ya na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị na steeti ahụ na steeti ndị ọzọ dị na gburugburu Anambra ga-ejikọ aka ọnụ wee memilaa ajọ ọnọdụ nchekwa na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria.

Ọ dọrọ ndị omekoome na ndị ọzọ na-ewèta àlà adịghị mma na steeti ahụ aja na ntị ka ha sepụ aka n’arụrụala, n’ihi na ọnọdụ ga-akawanyere ha njọ na steeti ahụ ugbua.

O kèlèrè aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo maka nkwàdo ya nye ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ, ọbụna dịka o kwere nkwa na ụlọọrụ ya na gọọmenti steeti ahụ ga-aga n’ihu ijikọ aka ọnụ n’agha ahụ a na-ebu megide mpụ na arụrụala na steeti ahụ.

Dịka ọ na-adọ ndị uweojii steeti ahụ aka na ntị ka ha dị uchu n’ọrụ ha ma rụọ ya n’usoro iwu kwàdoro site n’ịsọpụrụ ikike dịịrị mmadụ, ya bụ onyeisi ndị uweojii rịọkwazịrị njikọaka ọhaneze, ndị nta akụkọ na ụlọọrụ dị iche iche na steeti ahụ, iji nyere ha aka n’ọrụ inye steeti ahụ ezi nchekwa.

O nyekwara ndụmọdụ ka onye ọbụla nwere ozi ọbụla ga-enyere ndị uweojii aka n’ọrụ nchekwa maọbụkwanụ onye ọbụla ọnọdụ ọjọọ maọbụ ihe meberede ọbụla dabìdòrò kpọtụrụ ha bụ ndị uweojii ozigbo site n’akara ekwentị 112 maọbụ 07039194332 ka e wee gbatara ya ọsọ enyemaka aka-ọkụ aka-ọkụ.

Ya bụ Onyeisi ndị uweojii jikwara ohere ahụ wee kwupụta ihe dị icheiche ha mepụtagoro n’ọrụ nchekwa steeti ahụ n’ime abalị abụọ o jiri banye n’ọkwa, nke gụnyere mgbagbu a gbagburu ndị ntọ̀ abụọ n’Ichida, nzọpụta ha zọpụtara nwaanyị ndị ntọ ji, tinyere egbe, mgbọ egbe, ụgbọala na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ha nwetasịrị n’aka ndị omekome na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ ụbọchị Mọnde na ụbọchị Tuzdee.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles