23.2 C
Nigeria
Monday, May 20, 2024

Otu Onye Anwụọla n’Ihe Mberede Okporoụzọ Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu onye zutere ọnwụ mberede ya na nsonso n’ime steeti Anambra, dịka ụgbọala ise kwòkọ̀rọ̀ isi ọnụ n’ihe mberede okporoụzọ dapụtara na mpaghara Umunya.

Ya bụ ihe mberede okporoụzọ bụ nke mere na mpaghara Njikọụzọ Odumodu, nke okporoụzọ awara-awara ahụ si Nteje gaa Awka.

Dịka ozi a kụpụ̀rụ̀ site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ na-ahụ maka ije awele na steeti ahụ, bụ Federal Road Safety Corp (FRSC), RC Margaret Onabe siri kọwaa, ihe mberede okporoụzọ ahụ dapụtara ka ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere mbụ nke ehihie ụbọchị Satọdee.

O kwuru na ihe mberede okporoụzọ ahụ metụtara mmadụ iri abụọ na isii, nke gụnyere ụmụnwoke iri abụọ na ụmụnwaanyị isii, ma kwuo na otu onye n’ime mmadụ atọ ahụ nwụrụ anwụ, mmadụ iri na abụọ nwete mmerụahụ; ebe mmadụ iri na atọ abụọ ndị ọzọ pụtara n’enweghị ihe mmerụ ahụ ọbụla.

Dịka RC Onabe siri kọwaa site n’ozi ahụ, ndị ọnọmgbeomere kwùrù na ọ bụ ịgba oke ọsọ kpatara ihe mberede okporoụzọ ahụ, n’ihi na onye na-anya otu nnukwu ụgbọala nọ n’óké ọsọ, wee jiri ọsọ ahụ pịachara ma danyere ụgbọala anọ ndị ọzọ, n’ihi na ọ hụghị ha n’oge.

Ọ sịkwa na otu n’ime ụgbọala ahụ ọ dànyèèrè bụkwa nnukwu ụgbọala gwongworo bu mmanụ ọkụ; ma mekwa ka a mara na ndị ọrụ nsọnyụọkụ wụ̀chara ebe ahụ ozigbo ya bụ ihe mberede okporoụzọ mere, iji gbaa mmanụ ọkụ ahụ mmiri, ka o wee ghara ibinwuru ọkụ.

N’okwu ya banyere nke ahụ onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ Maazị Adeoye Irelewuyi kasìri ezinụlọ onye nke nke ahụ nwụrụ anwụ obi, ma kpee ka Chineke nabata mkpụrụobi ya na ndokwa ma nyekwa ya ezumike udo.

Dịka ọ na-adụ ndị na-anya ihe ọnyịnya ọdụ ka ha na-ebelata ịgba oke ọsọ, ọ kpọkukwàrà ha na-akpachapụ anya nke ọma, ma na-akpachàpụkwa anya oge ọbụla ha ruru ebe njikọụzọ dị, iji hụ ohere dị n’okporoụzọ tupu ha agbafèé, iji gbanahị ajọ ihe ọdachi dị etu ahụ ọzọ n’ọdịnihu.

Ọ gwàkwàzị̀rị̀ onye ọbụla na-anyà ụgbọala ka ha na-akpachàpụ̀ anya ka ha si agba iji belata ọnụọgụ ihe mberede okporoụzọ na-adapụtakarị.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles