32.5 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

E Jidela Ndị Ọnaụtụ Adịgboroja Yi Ákwà Ndị Ọrụ Gọọmenti n’Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti steeti Anambra anwụchikọọla ụfọdụ ụmụokorobịa anya na-apụ̀ ọkụ maka ibugharị onwe ha dịka ndị ọrụ gọọmenti, wee si n’ụzọ dị etu ahụ na-eme ụmụ mmadụ akaje dị icheiche ma na-anakọsịkwa ha ego ha tara ahụhụ kpata.

Ndị a bụ ndị a nwụchikọrọ site n’aka ụlọọrụ ‘Anambra State Internal Revenue Service (AIRS)’ dịka ha kwara akwa yiri, ma na-ebugharị onwe ha n’ụdị na ha bụ ndị ọrụ ụlọọrụ ‘Operation Clean and Healthy Anambra (OCHA Brigade)’.

Onyeisi Ngalaba Ọrụ n’ụlọọrụ AiRS, bu Dọkịta Christian Madubuko, bụ ya kwupụ̀tàrà nke a oge ọ na-akpụgharị ndị omekome ahụ n’isi ụlọọrụ ahụ dị n’Awka, bụkwa ebe ọ nọrọ kwuo na ndị ahụ so ná ndị na-eweta ala adịghị mma na ndị na-adọghachi aka elekere azụ na mbọ dị icheiche gọọmenti na-agba na steeti ahụ.

O kwuru na ọ bụ nnukwu ihe mwute na ọtụtụ ndị mmadụ ṅụrụ iyi na ha agaghị ekwe gọọmenti ṅụrụ mmiri tọ̀ba iko na steeti ahụ, n’agbànyèghị ihe dị icheiche a na-eme iji gbanwee echiche na akparamagwa ha.

Dịka o siri kọwaa, ndị ọrụ AiRS, OCHA Brigade na ndị òtù ọrụ ‘Task Enforcement Team (TET)’ na-agagharị ma na-arụ ọrụ gọọmenti dunyere ha, ha wee zute ụfọdụ ndị omekome na ọna ụtụ iwu akwadòghị̀ ebe ha na-ana ndị mmadụ ego, n’ụdị na ha bụ ndị ọrụ gọọmenti.

O mere ka a mara na ọ bụ n’Onitsha na n’Obosi ka e jidere ndị ahụ ebe ha nọ arụ ọrụ ọjọọ ha.

Dọkịta Madubuko gara n’ihu kwuo na ha enwetela ọtụtụ mkpesa dị icheiche banyere akaọrụ ndị omekome ahụ nà arụrụala ha na gburugburu ebe ahụ. O kwukwazịrị na ha ga-aga n’ihu ibu agha megide mpụ na arụrụala na ndị ọna ụtụ iwu akwadòghị̀ na steeti, n’ihi na nwatakịrị sị na nne ya agaghị arahụ ụra agaghị arahụkwa nke ya.

O chetazịịrị ọhaneze na ntụziaka ahụ na mmàchi ahụ a machiri ọrụ Agboro ka dịkwa ìrè na steeti ahụ, ọbụnadị dịka o fooro ntutu taa sị na gọọmenti na ụlọọrụ ya ga-aga n’ihu n’ịnwụchikọ ndị dị otu ahụ ma na-akpụpụkwa ha ụlọikpe, ka e were usoro iwe wee jụchasịa ma pịa ha ụtarị mmụọ.

Dịka ọ na-ekwu na a ga-akpụpụ̀ ndị ahụ ụlọikpe ebe a ga-eji usoro iwu wee lee ha ọrụ, Dọkịta Madubuko dụ̀kwara ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha na-akpọtụrụ ma na-enye ha mkpesa ozigbo banyere aka ọrụ ndị omempụ ahụ oge ọbụla ha hụtara ha.

N’ajụjụọnụ dị icheiche a gbara ha, ụfọdụ ndị ahụ e jidere gọrọ aka na ụkwụ ha, sị ha anaghị ana ndị mmadụ ego, kama na ọ bụ ọrụ obi ebere ka ha na-arụ site n’ịgbàzì etu ụgbọala si aga, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ n’okporoụzọ.

N’aka nke ha, ụfọdụ ndị ọzọ kwuru na ha mere ihe ahụ n’eziokwu, ma kwuo na o nwere otu nwoke dunyere ha ọrụ ahụ, bụkwa onye ha na-akwụ ego ole ha na ya kwekọrịtara kwà ụbọchị.

Ha rịọkwazị̀rị̀ ka a gbaghara ha, n’ihi na ọ bụ ọrụaka Ekwensu.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles