26.5 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

N’Awka, Ụmụakwụkwọ Kenneth Dike Emeela Nkwalite Omenala

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ ‘Kenneth Dike Memorial Secondary School, Awka’ dị na Obinagu, n’okpuruọchịchị ime obodo Awka South nke steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee merube emume nkwalite omenala Igbo, bụkwa nke ha nọrọ na ya wee gosipụta ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo.

Ya bụ mmemme dọtàkwàrà ndị sitere mpaghara ebe dị icheiche n’ala Igbo nà mpụ̀ga ya wee bịa, bụkwa ndị jiri ejiji ndị Igbo.

N’okwu ya na mmemme ahụ, Onyeisioche ‘Post Primary Schools Service Commission (PPSSC) na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Nkechi Ikediugwu kọwàrà ya bụ mmemme dịka nke kwesiri ekwesi na nke magburu onwe ya, n’ihi otu ọ ga-esi nye aka n’ịkwàlitè omenala Igbo, ọkachasị n’ebe umu.

O mere ka a mara na ndị Igbo nwere ọtụtụ dị icheiche e jiri mara ha, na-abụghị naanị asụsụ, egwu, na ejiji, n’ihi na omenala ndị Igbo rukwara n’obibindụ ha, nke mere na onye ọbụla bụ ezi nwaafọ Igbo nwere ụdị akparamagwa a gaghị ahụta na ndụ ya, ma nwekwa ụdị ndị ọ ga na-ebi.

Dịka ọ na-eto ndị haziri ya bụ ọgbakọ, Ọkammụta Ikediugwu jìkwàzị̀ ohere ahụ wee kpọkuo ndị Igbo ka ha na-akwalite omenala na njirimara ha, ma gwakwa ndị nne na nna ka ha na-akụziri ụmụ ha asụsụ Igbo ma na-asụkwara ha asụsụ ahụ oge niile.

Na mbụ n’ozi nnọọ ya, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Ebere Orji kọwàrà na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji kwalite omenala na ọnatarachi dị icheiche e ji mara ndị Igbo, ma mee ka ụmụaka na-eto eto ghọta uru ọ bara. O jikwara ohere ahụ kpọpụ̀tasịa ụfọdụ mkpa dị icheiche ụlọakwụkwọ ahụ na-enwe ugbua, ma rịọ gọọmenti steeti ahụ ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.

N’okwu nke ha dị icheiche, onye na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mpaghara Awka, bụ Dọkịta Uchenna Okeke; Odeakwụkwọ ụlọọrụ ‘Post Primary Schools Service Commission (PPSSC), Oriakụ Benedine Anagor; na Odeakwụkwọ ụlọọrụ ‘Anambra State Universal Basic Education Board (ABUBEB), Oriakụ Ebele Mgbemena kèlèrè ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo maka agbambọ ya n’Ịkwàlite na ichekwaba omenala na njirimara Igbo na steeti ahụ. Ha kelekwazị̀rị̀ ụlọakwụkwọ ahụ maka ịhazi ya bụ ọmarịcha mmemme, ma kpọkwa òkù ka onye ọbụla bụ nwaafọ Igbo mara na-asụ asụsụ Igbo ma na-akụzikwara ụmụ ya asụsụ Igbo, maka na ọ na-abụ onye kpọọ ọba ya mkpọkọrọ, agbataobi ewere ya kpoo ntụ.

A nọkwàrà na mmemme ahụ wee nye nkụzi pụrụ iche n’ihe gbasara omenala Igbo, gbaa egwu ọdịnala, ma rikwa ụdị erimeri ọdịnala dị icheiche e jiri mara ndị Igbo, tinyere ọtụtụ ihe ngosi dị icheiche e mere site n’aka ụmụakwụkwọ ahụ ụbọchị ahụ, iji mee ka ya bụ mmemme zaa aha a kpọrọ ya.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles