35.8 C
Nigeria
Sunday, May 19, 2024

Ụmụokpụ Anambra Bi USA Enyela Ndị Ihe Na-esiri Nkwàdó n’Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu jikọtara ụmụokpụ steeti Anambra bu na mpaghara North Texas nke mba USA ekesaarala ụfọdụ ụmụaka enweghị nne na nna na steeti Anambra ihe nkwàdó dịgasị icheiche e ji enyere ndụ aka.

Mmemme ịkesa ihe nkwàdó a bụ nke e mere n’ogige ụmụaka enweghị nne na nna dị n’Onitsha, Umuoji na Nnewi, ma bụrụkwa nke e sitere na ya wee kesaara ha ihe oriri dị icheiche, nke gụnyere akpa osikapa, ji, àgwà, ọkà índomi, na ụfọdụ erimeri ndị ọzọ.

N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere ikesà ihe ahụ, Onyeisi ndị ụmụokpụ ahụ bụ Joy Agwuna kwuru na nke ahụ bụ mmezupụ̀ta nkwà ha kwere oge gara aga na ha ga-kesara ndị ajadụ, ụmụaka enweghị nne na nna, na ndị ọzọ ihe na-esiri ike ihe nkwado.

Dịka ọ na-ekwupụ̀ta na obi dị ha ụtọ maka imezupụ̀tà nkwà ahụ ha kwere, o kelekwara Chineke maka iji kwara ngwaọrụ itinye ọchị n’ihu ndị ihe na-esiri ike, ọbụna dịka ọ kpọkukwara ndị ọzọ ọnọdụ dịịrị mma ka ha cheta ma nyere ndị ọnọdụ dịịrị aṅaa aka.

Na ntụnye nke ya, odeakwụkwọ otu ahụ, bụ Oriakụ Anthonia Ibe kelere ndị otu ahụ tụnyere ụtụ na ndị nyere aka n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji mezupụ̀ta ebumnobi ahụ.

Na nzaghachi ya n’aha ogige ụmụaka enweghị nne na nna, Oriakụ Bridget Adilo kèlèrè ndị òtù ahụ maka nkwàdó ha, ma kpekwazie ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji maka icheta ndị nọ na mkpa.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles