33.2 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

Ndị Anambra Arịọla Mgbataọsọ Gọọmenti Etiti Ebe Mbize Na-enye Nsogbu

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onye ọ na-eme omume omume na-ebe obube obube.

Ka ọ dị taa, a kpọkuola gọọmenti etiti ka ọ gbata ọsọ enyemaka n’ebe ahụ nnukwu mbize bidoro inye ajọ nsogbu na steeti ahụ na nsonso a, bụ nke dị na mpaghara Oba, n’ogologo ụzọ awara-awara ahụ siri Onitsha gaa Owerri.

Oku a bụ nke a kpọrọ oge ụfọdụ ndịisi ọchịchị steeti ahụ gara ileta ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ, n’ihi mmebi ahụ mbize ahụ mebiri na nsonso a wee kebie ụzọ awara-awara ahụ, oge nnukwu mmiri zochara.

Ndị soro gaa ya bụ njem nleta ọrụ gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, Maazi Ifeanyi Okoma; Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu, Injinia Felix Odimegwu; Onyeisi ndị ọrụ Gọvanọ Soludo, Ernest Ezeajughi; odeakwukwo mgbasaozi Gọvanọ, Maazi Christian Aburime; Onyeisioche okpuruọchịchị Idemili South, Oriakụ Amaka Obi, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n’ọrụ gọọmenti na n’ọchịchị obodo Oba.

N’okwu ya mgbe ha letechara ka ọnọdụ siri dị ebe ahụ, Kọmishọna ọrụ bụ Injinia Okoma kwara arịrị̀ etu mbize ahụ siri tiwaa otu akụkụ ụzọ ahụ, nke mezịrị ka ụlọ ndị mmadụ na ndị bi na gburugburu ebe ahụ nọrọzie n’ihe izendụ.

Ọ kpọpụ̀tàsị̀rị̀ mbọ dị icheiche gọọmenti steeti ahụ gbagoro iji gbochie mkpamkpa ahụ mbize ahụ na-akpa ma gbochie ya ikawanye njọ. O kwukwara na ya akpọkuola gọọmenti etiti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n’ebe ahụ, bụ nke amịtabeghị mkpụrụ a tụrụ anya, ọbụna dịka ọ kpọkukwara Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu ka o nye nkwàdó màkà arụmọrụ ahụ.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu, bụ Injinia Odimegwu kwùrù na steeti Anambra bụ steeti kachara nwee ọnụọgụgụ ebe mbize na-enye nsogbu n’ala Nigeria. O tinyekwàrà ọnụ wee rịọ gọọmenti etiti ka gbata ọsọ enyemaka n’ebe ahụ, n’ihi na ọ bụ naanị ụzọ ebe ahụ ya mbize ahụ na-akpa ike bụ ụzọ e si aga steeti Abia, Imo, na ụfọdụ steeti ndị ọzọ site na mpaghara Akwammiri Niger.

Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu n’ebe ahụ gụnyere Onyeisi ndị ọrụ Gọvanọ Soludo, Ernest Ezeajughi; odeakwukwo mgbasaozi Gọvanọ, Maazi Christian Aburime; Onyeisioche okpuruọchịchị Idemili South, Oriakụ Amaka Obi, tinyere Onyeisi ọchịchị obodo Oba, Maazị Osita Ubadi, bụ ndị kelere gọọmenti steeti ahụ maka mgbataọsọ ya ma rịọkwa gọọmenti etiti ka o mee ihe banyere ebe ahụ tupu ya bụ ajọ ọnọdụ ataa isi mmadụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles