26.5 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

Ka E Siri Jide Dibịa Chọrọ Iji Nwa Ya Gwọ Ọgwụ N’Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọkụkọ ntị ike na-anụ ihe n’ite ofe.

Ka ọ dị taa, aka ndị uweojii na steeti Anambra akparala otu nwoke maka imegide nwatakịrị ya na ya bi n’ụlọ, bụkwa onye ọ na-emegbukwa n’ụdị dị icheiche.

Nwoke ahụ, bụ Maazị Sunday Ezeh onye e jidere n’obodo ya bụ Nise, dị n’okpuruọchịchị ime Awka South nke steeti ahụ, na nsonso a, mgbe e nwetechara ozi banyere ihe ọjọọ dị icheiche o mere nwata ahụ, bụkwa nwa ya nwaanyị, ọkachasị site n’iti ya ihe ka a ga-asị na ọ bụghị mmadụ Chineke kere eke.

Dịka akụkọ siri kọọ, Maazị Ezeh, onye bụkwa dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ, ka e kwuru na o jiri achara, ụtarị na ihe ndị ọzọ dị icheiche wee merụsịchaa nwatakịrị ya na ha bi ahụ, ma bokwa ya ụdị apa dị icheiche n’ụdị na ọ na-apịa ya ihe ma na-enye ya ntaramahụhụ maka ihe o mere.

Nwatakịrị nwaanyị ahụ o mere ihe ahụ, bụ nwaada Ezeh bụ onye gbara naanị afọ iri na asaa, ma bụrụkwa onye nọ ugbua anara ọgwụgwọ n’otu ụlọọgwụ dị n’Awka.

N’akwa edinà ebe ọ nọ n’ụlọọgwụ ahụ, a hụrụ na otu akụkụ isi ya zara aza ma na-eme rupum rupum, n’ihi achara na ihe ndị ọzọ nna ya kụrụ ya n’isi. A hụkwara na ụkwụ ya zara aza ma na-agụsị mmiri, ebe ebe ụdị apa dị icheiche dịgasịkwa ya n’aka na n’ụkwụ, tinyere ọnya dị icheiche dịgasị n’ahụ ya.

N’ajụjụọnụ a gbara nwoke ahụ banyere ihe o jiri nwee obi mee nwa ya ụdị ihe ahụ; o kwuru na nwa ya nwaanyị ahu gara nyụọ nsị na mamịrị n’ime ụlọ dị icheiche, bụkwa nke ọ sị na ọ dọọla ya aka na ntị ọtụtụ ugboro ka ọ kwụsị ime ya, mana ọ naghị anụ, nke mezịrị o jiri kụọ ya ihe etu ahụ.

Akụkọ kọkwara na ya bụ nwoke jiri eriri wee kechido nwata ahụ n’azụ ụlọ oge ahụ ọ kụchara ya ihe Tinka kụrụ paanụ̀, wee jụ na ọ gaghị enye ya nri maọbụ mmiri ọtụtụ ụbọchị, ka o wee ghara ịnyụ nsị ọzọ. Ọ bụzị n’ikpeazụ ka ndị agbataobi mechaara chọpụta ihe na-eme, wee kpọtụrụ ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze na steeti Anambra, ha wee batazie n’okwu ahụ; e wee kpọga nwata ahụ ụlọọgwụ.

Mgbe a jụrụ ya ihe mere na ọ kpọghị nwata ahụ gaa ụlọọgwụ mgbe ọ kụchara ya ihe ahụ wee hụ ka ọnọdụ ya siri dị; Maazị Ezeh, onye lụgokwara ọtụtụ nwaanyị ma chụlachaa ha niile, kwuru na o nweghị ego dị ya n’aka ọ ga-eji kpọrọ nwata ahụ gaa ụlọọgwụ. O mekwara ka a mara na ya onwe ya chọkwudị̀rị̀ enyemaka ego ọ ga-eji kpatara ezinụlọ ya nri, n’ihi na ọrụ anaghị adịkarịzị.

Ọ gakwazịrị n’ihu rịọ ka a gbaghara ya, n’ihi na ihe ahụ bụ ọrụ aka Ekwensu, tinyekwuoro na ọ bụ iwe ka o jiri mee ya.

N’okwu ya banyere akparamagwa ọjọọ ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị na ụmụaka na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ify Obinabo gbarụ̀rụ̀ ihu banyere ụdị arụrụala dị etu ahụ, ma katọ̀kwa etu ụfọdụ ndị mmadụ sizị̀ agbasa ụmụ ụmụaka ajọ ihe ugbua ma na-emegbukwa ha emegbu.

O mere ka a mara na a ga-akpụpụ̀ ndị ahụ ụlọikpe ebe a ga-eji usoro iwu wee nyụchaa ha anya, ka ndị ọzọ wee mụrụ akọ.

E nyefèzị̀kwàrà nwoke ahụ n’aka ndị uweojii steeti Anambra maka ime nnyocha na ịkpụpụ̀ ya ụlọikpe ozigbo, ebe nwata nwaanyị ahụ nọkwa n’ụlọ ahụike ugbua maka inye ha ezi nlekọta na ọgwụgwọ.

Ka ọ dị ugbua, a waala ya bụ nwata isi, iji wepusịa ọbara ọjọọ ahụ nna ya tikọ̀lọ̀tara ya n’isi. Ọ nọkwazị n’ụlọ ahụike Nkụzi Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n’Awka anara ọgwụgwọ ugbua, ma na-agbakerekwa.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles