32.1 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

Lamido Adụọla Ndị Ụka Ka Ha Na-edebe Okwu Chineke, Tòó Dayọsis Niger

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ndị mmadụ, ọkachasị ndị ụka ka ha bụrụ ndị na-edebe okwu Chineke na-emekwa ya eme oge niile ka ihe wee gaara nke ọma.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ onye ji ọkwa Diin (Dean) nke ụka Angịlịkan n’ala Nigeria, bụ ‘Most Rev.’ Ali Buba Lamido n’okwu ya na mmemme ọgbakọ sinọọdụ Dayọsiisi Niger nke afọ 2023.

Ya bụ sinọọdụ bụ nke abụọ n’ime àgbà sinọọdụ nke iri atọ na abụọ Dayọsis ahụ na-eme, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’ụlọụka St. John’s Anglican Church, Fegge, dị n’Onitsha, n’okpuruọchịchị ime obodo Onitsha South nke steeti Anambra.

 

N’okwu ya n’ebe ahụ, Ashbisọp Lamido kọwara na ndụ ezi onye òtù Kraịst bụ ngosipụta ụdịdị Chineke nà ịgbaso usoro o si eme ihe, ọbụna dịka ọ kpọkuru ndị ụka ka ha bụrụ ndị òtù Kraịst n’eziokwu ma na-egosipụta ya n’okwu ọnụ ha na omume ha oge niile.

Dịka ọ na-akatọ etu ụfọdụ ndị ụka si eme omume anaghị egosi na ha bụ ndị òtù Christ, ya bụ nnukwu onyeisi ụka Angịlịkan jìkwàzịrị ohèrè ahụ wee too Dayọsis ahụ na Bishọp ya maka ọrụ ọma dị icheiche ha na-arụ na ụzọ dị icheiche Chineke si eji ha akwara ngwaọrụ.

O tokwara ha maka ihe dị icheiche ha mepụtagoro dịka Dayọsis, ọkachasị site n’ịkụ̀tàrà Kraịst mkpụrụobi, igbasa ozi ọma ala eze eluigwe, na ịkwàlìtè mmụta na agụmakwụkwọ site na mahadum na ogige mmụta dị icheiche ha guzobegoro na mpaghara ebe dị icheiche na Dayọsis ahụ. O kpekwazị̀rị̀ ka Chineke gaa n’ihu iji ha na-akwara ngwaọrụ n’ụzọ pụrụ iche.

Na mbụ n’okwu nke ya, Bishọp ụka Anglịkan na Dayọsis Niger, bụ Bishọp Owen Nwokolo kpọpụ̀tàsị̀rị̀ ihe dị icheiche ha mepụtagoro na Dayọsis ahụ site n’enyemaka Chineke.

O kelekwazị̀rị̀ ndị ụlọụka na ashdikinri buru sinọọdụ nke afọ, nà ndị dị icheiche tụnyere ụtụ n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji mee ka ya bụ sinọọdụ gaa nke ọma; ọbụna dịka o kpere ka Chineke gọzie ma kwụghachi ha niile mmaji kwuru mmaji.

N’okwu ya n’ebe ahụ, Ashbishọp Mpaghara Owerri, Ashbishọp David Onuoha kọwara akwụkwọnsọ dịka ihe nlegaraanya nà ùgègbè na-agbàzi ije, ndụ na nzọụkwụ mmadụ, ma nwekwa ike inwòghàrị ndụ mmadụ.

O kwuru na ọ bụ onye ọbụla ma okwu Chineke nke ọma ma na-emekwa ya eme bụ ezi onye òtù Christ, bụkwa onye nwere ọtụtụ úrù ọ ga-erite site n’ime nke ahụ; ọbụna dịka ọ kọwara dayọsisi mpaghara Niger dịka ọkaibe n’ala Nigeria, ma kèlee Bishọp Nwokolo maka ihe dị icheiche o mepụtagoro na Dayọsis ahụ, kpọkukwa ndị òtù Christ ka ha gaa n’ihu inye ya nkwàdo, ma na-adàbere n’okwu Chineke oge niile, maka na Chineke anaghị agharịpụ.

Oke mmemme sinọọdụ ahụ wéré ụbọchị anọ, bụ nke a nọrọ na ya wee wee nwee mkparịtaụka ma kpéé ekpere maka ọdịmma dayọsiisi ahụ, kpéé usoro ekpere dị iche iche maka ọdịmma ala Nigeria, chụọ nta ego ego maka ịkwalite ọrụ mmepe na dayọsiisi ahụ, waa achịcha bekee e mere maka sinọọdụ ahụ, bụọ abụ olu ọma dị icheiche, ma gọzikwa obodo ahụ buru ya bụ sinọọdụ nà ụmụafọ ya, tinyere ihe ndị ọzọ mere ka sinọọdụ zaa aha a kpọrọ ya n’eziokwu.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles