23.2 C
Nigeria
Monday, May 20, 2024

E Meela Ụbọchị Anyarị n’Anambra, Kpọọ Gọọmenti Oku Nkwàdó

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola gọọmenti n’ogoogo dị icheiche ka ha nyere ndị ànyàrị (albino) aka n’ihe dị icheiche ha na-agabiga, ya na iji hụ na mbọ dị icheiche ha na-agba iji gbochie ọrịa kansa ime ha mị̀tàrà mkpụrụ a tụrụ anya.

Onyeisi òtù ahụ jikọtara ndị ànyàrị n’ime steeti Anambra, bụ Vivian Ezeonwumelu bụ ya kpọrọ oku a na n’okwu ya n’ọgbakọ e jiri merùbe Ụbọchị Ndị Anyarị na Mba Ụwa, nke afọ 2023, bụkwa nke weere ọnọdụ n’ogige ‘Dora Akunyili Women Development Centre’ dị n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.

Na nkụzi ya na mmemme ahụ, nke Oriakụ Ezeonwumelu nyèrè nkọwa banyere ihe ndị ànyàrị acha oke ọcha nàkwà ihe kpatara ọnọdụ ahụ ha jiri dị etu ọ dị, na-enwe mmetụta anwụ na ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ dị icheiche. Ọ gbarụrụ ihu banyere etu ụfọdụ gọọmenti n’ebe dị icheiche si eleghàrá ndị anyarị anya, etu e si emeso ha, na ihe dị icheiche ha na-agabiga; ma kpọọ òkù ka e weputesie amụma iwu ga-enye aka ibelata nke ahụ ma kwàlite ọdịmma ndị ànyàrị.

N’okwu nke ya, onye ọzọ nyekwara nkụzi na mmemme ahụ, bụ Maazị Ugohukwu Ezeonwumelu nke Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka, katọ̀kwarà etu ụfọdụ ndị mmadụ si agbara ndị ànyàrị ọsọ, ya na etu ụfọdụ gọọmenti si eleghàrá ndị ànyàrị anya n’ịkpọlite n’ọrụ. Ọ kpọkùkwazị̀rị̀ òkù ka onye ọbụla na-eme ihe dị etu ahụ sepu aka na ya, n’ihi na ndị anyarị bụkwa mmadụ Chukwu kere eke n’ụdị nke ha ka ha bụ.

Ọ gwara ọtụtụ ndị anyarị bịara mmemme ahụ ka ha ghara imechi ọnụ ha maọbụ gba nkịtị, kama ka ha mee ka ụwa nụ olu ha, iji mee ka e nwee mgbanwe n’etu ndị mmadụ si ahụta ha nà n’ihe dị icheiche abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu maọbụ na-eche banyere ha. Ọ gwakwara ha ka ha na-eleru onwe ha anya nke ọma, na-ebi ndụ gbasiri ike, ma zèkwara ịnọ n’oke anwụ maọbụ ime ihe ndị ọzọ pụrụ iwetara ha ajọ ọnọdụ ahụike.

Ọ gàrà n’ihu kpọkukwazie ndị nne na nna nwere anyarị ka ha na-eleru ha anya nke ọma oge niile, ma gharakwa iji ahụike ha gwurie egwu, n’ihi na nke ahụ pụrụ iweta ọrịa maọbụ ọnwụ mberede.

Na mbụ n’okwu nke ya, Onyeisioche otu jikọtara ndị ikedịnobi n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Ugochukwu Okeke rịọrọ gọọmenti steeti Anambra na Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ ka o mee ya ka ọ bụrụ iwu na a ga na-enye ụmụakwụkwọ ndị bụ ànyàrị ohere ịnọ n’ihu oche n’ụlọakwụkwọ ha, ka ha wee nwee ike ịdị na-ahụ ihe e dere ede.

Ọ gwakwara gọọmenti ka o mee ka ụlọakwụkwọ dị icheiche dịgasị na steeti ahụ kụọ osisi na na-eche ndò, iji gbochie oke anwụ ịdị na-acha ndị ànyàrị, n’ihi ihe dị icheiche nke ahụ na-eweta n’ọnọdụ ahụike ha.

N’okwu nke ha n’otu n’otu, ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Maazị Chuks Ezewuzie na Willie Obiozor kèlèrè otu chịkọbara ya bụ ọgbakọ; ma gwa ndị otu ahụ jikọtara ndị anyarị na steeti Anambra ka ha gba mbọ na-eme ka ozi gbasaara ha na mmemme ọbụla ha na-eme na-eru gọọmenti ntị, ọkachasị isi ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike, isi ụlọọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ, na ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ, ma n’ogoogo steeti, ma n’ogoogo gọọmenti etiti.

Ha kpọkwazịrị òkù ka a gba mbọ hụ na e nwere ezi amụma iwu maka nchekwa ikike dịịrị ndị anyarị na steeti dị icheiche.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles