26.5 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

Ezekwesili na Ndị Ọzọ Akatọọla Etu Gọọmenti Si Akụ́tùsi Ụfọdụ Ụlọ n’Ahịa Alaba

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ ugbua na gọọmenti Steeti Lagos amalitela ikuri ụfọdụ ụlọ na mpaghara ahịa ‘Alaba International Market’ dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ojo nke steeti ahụ.

Ịkụtùsi ụlọ ahịa ahụ bụ nke a malitere ụbọchị ụka, ma bụrụkwa nke a na-eme n’agbànyèghị nkatọ̀ ọtụtụ ndị mmadụ na-akato atụmatụ ikutu ụlọ ndị ahụ, ma na-ekwu na nke ahụ na-egosi mmegbu a na-emegbu ndị si mpaghara Ndịda-ọwụwa Anyanwụ (ndị Igbo) bi ma na-azụ ahịa na Lagos.

Gọọmenti Steeti Lagos adịlarị na mbụ maa ọkwa n’isi ngwụcha izuụka gara aga banyere mkpebi ya ịkụtùsi ụlọ ndị ahụ, bụ ndị o kwuru na ha emeela ochie ma na-achọkwa ịda ada, nke mezịrị e jiri kpebie ịkụtùsi ha, iji gbanahị ajọ ọnọdụ mberede nwere ike ịdapụta ma a hapụ ụlọ ndị ahụ ka ha jiri aka ha daa.

Gọọmentị Lagos kwukwara na ọ bụghị ahịa ‘Alaba International Market’ kpọmkwem ka a na-akutu, kama na ọ bụ ụfọdụ ụlọ dị n’okirikiri ahịa ahụ bụ ndị esizighi ike, nke nwekwara ike ịda oge adịghị anya.

Kaosiladị, ụfọdụ ndị nkutu ụlọ a metụtara ụlọahịa ha kwuru na ọ bụ eziokwu na gọọmentị enyebụọla ndị nwe ụlọ ndị ahụ akwụkwọ ịdọ aka na ntị na nsonso a, mana ha na gọọmentị na-enwe mkparịtaụka iji mara ihe ha nwere ike ime iji gbochie nkụtu ụlọahịa ha.

Ha mekwara ka a mara na ọtụtụ n’ime ụlọ ndị ahụ a kụtusiri bụ ụlọ dịgasị mma, n’enweghị ihe mere ha, e wee bịa kụrụ ha deberuo ala. Ha kwukwara na ha kwụrụ ụgwọ ruru nde kwuru nde naịra n’aka ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti Steeti Lagos n’ihi okwu ahụ, mana gọọmenti mechaara kụtusie ụlọ ahụ, bụkwa nke ha kwuru na o metụtara ha n’ụzọ dị dị ukwuu ma wutekwa ha.

N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị na-azụ ahịa n’ahịa ahụ, bụ Maazị Geoffrey Mbonu, katọ̀rọ̀ nkụtù ụlọ ahụ dịka mmadụ ịkpacha anya megide mmadụ ibe ya.

O mere ka a mara na ọbụnadị ụfọdụ ụlọ ndị a kabụ̀ghị̀ akara nkụtù n’oge mbụ, na e sokwazị̀rị̀ kụtuo ha niile ugbua n’ebe ahụ, bụ mpaghara ebe ndị Igbo juru ma na-azụ ahịa. Ọ katọ̀kwarà usoro e siri kpebie ma bagide n’ọrụ ịkụtùsi ụlọ ahụ, ma mekwa ka a mara na gọọmenti agwaghị ha onwe ha bụ ndị isi ahịa ahụ banyere nke ahụ. O kwukwara na e nyeghị ndị nwere ngwaahịa maọbụ ngwongwo ndị ọzọ n’ime ụlọ ahụ a kụtusiri ohere zuru okè ka ha kwapụ̀chaa ihe ha tupu ebido ya bụ ịkụtùsi ụlọ, ọkachasị ndị nke e nyeghị ọkwa ịdọ aka na ntị; ma mee ka a mara na nke ahụ mekwazịrị ka e bibie ọtụtụ ihe ndị mmadụ n’ebe ahụ.

Maazi Mbonu kpọkùkwazị̀rị̀ aka na-achị steeti Lagos, bụ Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka ma bịakwa n’ebe ahụ jiri anya ya hụ ka ihe si aga, maka na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya mmadụ ịkpacha anya na-emegide mmadụ ibe ya.

Na ntụnye nke ya n’okwu ahụ site n’ozi ọ kụpụrụ site n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, onye ahụ bụbụ Minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ n’ala Nigeria, bụ Oriakụ Oby Ezekwesili gbarụ̀kwàrà ihu banyere etu e siri mee ya bụ ihe, ma kọwaa ya dịka ihe e mere n’usoro ekwesighị ekwesi nà ihe a kpachapụ̀rụ̀ anya wee mee iji megide ndị Igbo nọ ebe ahụ.

Ọ màrà Gọvanọ Steeti Lagos bụ Sanwo-Olu aka ka o weputa ihe akaebe gosiri na ọ kpachaghị anya mee ihe ahụ iji megide ndị Igbo nọ ebe ahụ. Ọ gwakwara Gọvanọ Sanwo-Olu gosi ụwa mgbe o jiri nye ndị ahụ akwụkwọ ịdọ aka na ntị, ohere o nyere ha iji busie ngwongwo ha, na mgbe o jiri bido ịkụtùsi ụlọ ahụ, ma ndị nke dị mma, ma ndị nke ọ sị mebiri emebi.

Oriakụ Ezekwesili kpọkùkwazị̀rị̀ Onyeisiala Nigeria, Maazi Bola Tinubu ka o leba anya n’okwu ahụ ma hụ na e mere ihe kwesiri na a ga-eme banyere ya bụ ọnọdụ, n’ịgbaso usoro nwa mmadụ emegbula nwa mmụọ, nwa mmụọ emegbukwala nwa mmadụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles