23.2 C
Nigeria
Monday, May 20, 2024

Gọọmenti Anambra Ekwenwòólá Nkwà Imemìla Ajọ Ọnọdụ Nchekwa na Iju Mmiri

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịchị steeti Anambra ekwupụ̀tanwoola ezi njikere ya ịga n’ihu n’ibu agha megide nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa na ajọ ọdachi iju mmiri n’ime steeti ahụ.

Osote aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim bụ ya kwupụ̀tàrà nke a n’okwu ya oge ya na ụfọdụ ndị otu dị icheiche na-ahụ maka ọnọdụ gbanụ̀gbanụ̀ n’ime steeti ahụ nwere ọgbakọ na nsonso n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Ya bụ mmemme bụkwa nke dọtara ndị e ji okwu ha agba izu na mpaghara ebe dị icheiche iju mmiri na-enye nsogbu n’ime steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ndị òtù ‘Achieving Health Nigeria Initiative (AHNI)’, ndị òtù ‘United Nations Programme on HIV and AIDS (UNAIDS)’, ‘United Nations International Children’s Emergency Fund (UNICEF)’ na òtù ndị ọzọ sonyèkwara na ya.

N’okwu ya n’ebe ahụ, Dọkịta Ibezim kwuru na ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo na-agba mbọ esepu aka iji weta n’isi njedebe, nsogbu na mkpamkpa ahụ iju mmiri na idei mmiri na-akpa na mgbe na mgbe n’ime steeti Anambra, bụkwa nke o kwuru na ọ na-akawanye njọ n’oge udummiri.

Ọ kpọkuzịkwara ọhaneze steeti ahụ ka onye ọbụla tinye aka n’ọrụ na mbọ ahụ a na-agba, ọkachasị site n’ịkwalite ezi ọnọdụ gburugburu na isepu aka n’ihe ọbụla nwere ike imetọ̀sị̀ ajọ ọnọdụ gburugburu n’ụdị ọbụla.

Banyere ọnọdụ nchekwa, Dọkịta Ibezim kpọpụ̀tàsị̀rị̀ mbọ dị icheiche ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ gbagoro na nke ọ ka na-agba n’ịkwalite ezi ọnọdụ nchekwa steeti ahụ, bụkwa nke o kwuru na ọ na-amị̀ta mkpụrụ a tụrụ anya, dịka ọ dị ugbua na steeti ahụ. O chetekwaara ndị Anambra na nchekwa bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla, ma nye ndụmọdụ ka onye ọbụla hụtara ọnọdụ maọbụ ijeụkwụ dị aṅaa na mpaghara ya ka ọ kpọtụrụ ndị ọrụ nchekwa ozigbo maka ime ihe banyere nke ahụ.

N’okwu ha n’otu n’otu, ụfọdụ ndị sonyere n’ọgbakọ̀ ahụ, Adaoha Anosike na Moses Ohamaeme, kèlèrè ọchịchị steeti ahụ maka ihe o mepụtagoro na ngalaba ahụ dị icheiche, ma kwe nkwà ịga n’ihu na-enye ya nkwàdo kwesiri ekwesi na iburu ozi ahụ gaa gbasaa ya n’ime obodo ha dị icheiche, maka na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles