26.3 C
Nigeria
Sunday, April 28, 2024

Akụkọ Ifo: Ihe Mere Na Ezi Enweghị Mpi

 

Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

N’OGE mbụ, ezi nwere mpi. N’ihi ya ọ na-alụso ụmụanụmanụ ibeya ọgụ oge niile ma werekwa ya na-akpa ike dị egwu.

Agwa ọjọọ ahụ ezina-akpa bidoro webe ụmụanụmanụ iwe ma o nweghị ihe ha pụrụ ime. Ha gaa nzukọezi agaghị ekwe ka anụmanụ ọzọ tinye ọnụ, onye mee pịm o bido ọgụ.

Ụbọchị egwu jịdagharị bụ otu ụbọchị nkịta nọ na mmiri na-ańụ mmiri, ezi gbadatara na mmiri sịnkịta ka ọ pụta ka ya ńụọ mmiri. Nkịta jụrụ na ọ gaghị apụta na mmiri dịka ọgwara ezi na ya ańụchabeghị. Ka ọ malitekwara ịṅụ mmiri ezi makwasra ya n’ike dịegwu ma were mpi ya merụchaa ya ahụ. Ọ fọrọ obere ka nkịta nwụọ.

Ihe ezi mere nkịta enyeghị ụmụanụmanụ ọnụ okwu. Ya mere, ha nọrọ nzukọ nke ha emeghị ka ezi marawee kpebie na eze ha bụ mbe ga-aga na be chi okike kere ha gwa ya ka ọ napụ ezimpi o nyere ya,n’ihi na a hapụ ya ka o jiri aka ahụ na-aga na ọ ga-egbucha ụmụmanụniile otu ụbọchị. Mbe nabatara okwu ha.

N’ụzọ ụtụtụ echi ya,mbe zọpụrụ ụkwụ ije wee gaa na nke chi okike. Mgbe ọ garuru, ọ kọwaara ya iheniile ezi na-eme na ihe ụmụanụmanụ chọrọ ka o mee. Chi okike kwetere wee napụezi mpi ozugbu. Otu a ka ezi si bụrụ anụ enweghị mpi ruo taa.

IHE MMỤTA: Onye ejina ihe o nwere akpa nganga.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles