33.3 C
Nigeria
Tuesday, May 7, 2024

N’Anambra, Kọmishọna Obinabo Agaala Leta Nwa Nna Ya Chọrọ Itigbu n’Ụlọọgwụ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Kọmishọna na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị na ụmụaka na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ify Obinabo, agaala leta nwatakịrị ahụ gbara afọ iri na asaa, onye nna ya chọrọ itigbu, na nsonso a.

Kọmishọna Obinabo, onye gara leta nwatakịrị nwaanyị ahụ n’ụlọọgwụ ebe ọ nọ anara ọgwụgwọ n’ụlọ ahụike Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, kwukwazị̀rị̀ na nwata ahụ ga-agbakerecha oge adịghị anya ma si n’ụlọọgwụ ahụ laa.

Ya bụ Kọmishọna, onye kwupụ̀tàrà obiụtọ ya maka etu ọnọdụ nwata nwaanyị ahụ dị̀zị̀ ugbua, kasikwara nwata ahụ obi maka ihe ụfụ dị icheiche ọ gabigara n’ime ọnọdụ ahụ, ma kwenwòó ya nkwà na gọọmenti kwụ̀ ya n’azụ ma burukwa ọdịmma ya n’obi.

Kọmishọna Obinabo gbarụ̀rụ̀ ihu banyere ụdị arụrụala dị etu ahụ nna nwatakịrị ahụ rụsara ya, ma katọ̀kwa etu ụfọdụ ndị mmadụ sizị̀ agbasa ụmụ ụmụaka ajọ ihe ugbua ma na-emegbukwa ha emegbu. O kwukwazị̀rị̀ na gọọmenti agaghị ada mbà ịnwụchikọ onye ọbụla ga-eme ihe dị etu ahụ ọzọ na steeti ahụ na inye ya ntaramahụhụ kwesiri ya.

Ọ dị ncheta na nwatakịrị ahụ bụ onye e bugara ụlọọgwụ ahuy oge e jidechara nna ya bụ Maazị Sunday Ezeh n’obodo ya bụ Nise, dị n’okpuruọchịchị ime Awka South nke steeti Anambra na nsonso a maka ozi e nwetere banyere ihe ọjọọ dị icheiche o mere nwa ya nwaanyị ahụ, ọkachasị site n’iti ya ihe ka a ga-asị na ọ bụghị mmadụ Chineke kere eke.

Dịka akụkọ siri kọọ, Maazị Ezeh, onye bụkwa dibịa mgbọrọgwụ na mkpaakwụkwọ, ka e kwuru na o jiri achara, ụtarị na ihe ndị ọzọ dị icheiche wee merụsịchaa nwatakịrị ya na ha bi ahụ, ma bokwa ya ụdị apa dị icheiche n’ụdị na ọ na-apịa ya ihe ma na-enye ya ntaramahụhụ maka ihe o mere.

N’akwa edinà ebe ọ nọ n’ụlọọgwụ ahụ anara ọgwụgwọ oge ahụ, a hụrụ na otu akụkụ isi ya zara aza ma na-eme rupum rupum, n’ihi achara na ihe ndị ọzọ nna ya kụrụ ya n’isi. A hụkwara na ụkwụ ya zara aza ma na-agụsị mmiri, ebe ebe ụdị apa dị icheiche dịgasịkwa ya n’aka na n’ụkwụ, tinyere ọnya dị icheiche dịgasị n’ahụ ya.

N’ajụjụọnụ a gbara nwoke ahụ oge ahụ banyere ihe o jiri nwee obi mee nwa ya ụdị ihe ahụ; o kwuru na nwa ya nwaanyị ahu gara nyụọ nsị na mamịrị n’ime ụlọ dị icheiche, bụkwa nke ọ sị na ọ dọọla ya aka na ntị ọtụtụ ugboro ka ọ kwụsị ime ya, mana ọ naghị anụ, nke mezịrị o jiri kụọ ya ihe etu ahụ.

Akụkọ kọkwara na ya bụ nwoke jiri eriri wee kechido nwata ahụ n’azụ ụlọ oge ahụ ọ kụchara ya ihe Tinka kụrụ paanụ̀, wee jụ na ọ gaghị enye ya nri maọbụ mmiri ọtụtụ ụbọchị, ka o wee ghara ịnyụ nsị ọzọ. Ọ bụzị n’ikpeazụ ka ndị agbataobi mechaara chọpụta ihe na-eme, wee kpọtụrụ ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze na steeti Anambra, ha wee batazie n’okwu ahụ; e wee kpọga nwata ahụ ụlọọgwụ.

Mgbe a jụrụ ya ihe mere na ọ kpọghị nwata ahụ gaa ụlọọgwụ mgbe ọ kụchara ya ihe ahụ wee hụ ka ọnọdụ ya siri dị; Maazị Ezeh, onye lụgokwara ọtụtụ nwaanyị ma chụlachaa ha niile, kwuru na o nweghị ego dị ya n’aka ọ ga-eji kpọrọ nwata ahụ gaa ụlọọgwụ. O mekwara ka a mara na ya onwe ya chọkwudị̀rị̀ enyemaka ego ọ ga-eji kpatara ezinụlọ ya nri, n’ihi na ọrụ anaghị adịkarịzị.

Ọ gakwazịrị n’ihu rịọ ka a gbaghara ya, n’ihi na ihe ahụ bụ ọrụ aka Ekwensu, tinyekwuoro na ọ bụ iwe ka o jiri mee ya.

Ka ọ dị taa, nwoke ahụ nọkwazị n’ụlọ mkpọrọ esì ígwè n’imi ugbua ma na-anara ụgwọ ọrụ ya maka ihe o mere.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles