23.2 C
Nigeria
Tuesday, May 7, 2024

‘Sit-at-home’: Ekpa Akpọọla Ubah ‘Afọ Nsị’ Maka Okwu Ndụmọdụ Ọ Gwara Ndị Igbo

 

Izunna Okafor dere akụkọ

Nwa amadi ahụ sị na ya na-azọ maka nnwere onwe Biafra, bụ Maazị Simon Ekpa, akọwaala onye ahụ na-anọchite mpaghara ‘Anambra South’ n’ụlọ omeiwu Sineti ala Nigeria, bụ Sinetọ Ifeanyi Ubah, dịka ‘afọ nsị’ n’ihi ndụmọdụ ahụ o nyere ndị Igbo ka ha kwụsị irube isi n’iwu ya na ntụziaka ‘onye apụ̀takwala iro’ ahụ o nyere ndị Igbo na nsonso a.

Ọ dị ncheta na Ekpa, bụ nwaafọ steeti Ebonyi bí na mba Finland, nyèrè iwu ka onye Igbo ọbụla chịbàá ụkwụ ụlọ ma gharakwa ịpụ̀ta iro maọbụ gaa ebe obula n’ime izuụka, iji gosi na obi adịghị ha mma banyere mkpọchi ahụ a kpọchiri onyeisi òtù ‘Indigenous People of Biafra (IPOB)’ n’ụlọọrụ ‘Department of State Service (DSS)’; ya na iji mee ka a tọhapụ ya.

Kaosiladị, Sinetọ Ubah, n’okwu ọ gwara ndị ọgbọ nta nkwado ya na ndị Igbo niile na nsonso, gwara ha ka ha kwụsị irube isi nye iwu ‘onye apụ̀takwala iro’ ahụ nà ntụziaka ndị ọzọ dị etu ahụ Maazi Ekpa na-enye, n’ihi etu nke ahụ si emetụta ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ ma na-ebikwa ọnọdụ akụnụba ndị Igbo aka ọjọọ n’ụzọ dị icheiche.

Dịka ọ na-adụ ndị Igbo ọdụ ka ha na-agara onwe ha ọrụ, ahịa na ebe ndị ọzọ kwesi ekwesi ha chọrọ ịga n’atụghị egwu ọbụla; Ubah kwekwara ha nkwà ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgba.

Ọ dị ncheta na Sinetọ Ubah emegokwa ọtụtụ ihe dara ụda n’ịkwàdò ndị ọrụ nchekwa nà n’ịkwàlite ọnọdụ nchekwa ndụ na akụnụba na mpaghara ya.

Ya bụ Sinetọ dọ̀kwàzị̀rị̀ Ekpa aka ná ntị banyere etu o si akpụtọ̀ aha ya, ma gwa ya ka ọ hàá ya aka ma kwụsịkwa itinye ụmụ mmadụ n’égwù, ọnọdụ ihe ụfụ na ntaramahụhụ, ebe ya onwe ya nọ na mba Finland na-ekpori ndụ.

Kaosiladị, na nzaghachi ya site n’onyoonyo ọ kụpụrụ na nsonso a n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, ya bụ dike a na-aba ntị ka a na-aba ji, bụ Maazị Simon Ekpa, kpọrọ Sinetọ Ubah ‘afọ nsị’, ma gwakwa ya ka ọ kpachara anya ya.

O kwukwara na ya bụ Sinetọ ga-enwete ozi ịdọ aka na ntị ya oge adịghị anya.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles