30.7 C
Nigeria
Sunday, April 28, 2024

Udummiri: Ndị Anambra Ebidola Ịkọ̀chasị̀ Ọ̀wà Mmiri Ha n’Ịgbasò Ntụziaka Gọọmenti

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-adị mma ịma ọkwa mmiri tupu ozuzo ya, ma na-adịkwa mma iji ehihie wee chụba ewu ojii, maka na chi jie, ọ hịa ahụ njide.

Ọ bụ n’ịgbaso nke a ka gọọmenti steeti Anambra jiri kpọọ òkù na nsonso a ma dụọ ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha kọ̀chasịa ma na-edebe ọwà mmiri ha ọcha, kwụsịkwa iji únyí, atịtị na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ were na-emetọ maọbụ na-asụchisi ọwà ọwà mmiri dị na mpaghara ha, ọkachasị̀ ugbua a nụ̀bàgoro isi udummiri.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka Gburugburu na steeti Anambra, bụ Maazị Felix Odimegwu, site n’ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ na nsonso, bụkwa nke o sitere na ya wee nye nkọwa banyere mkpa ọ dị ịkọchàsị ọwà mmiri suchisiri àsụchi na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ. O kwuru na ebumnobi nke ahụ bụ iji hụ na mmiri na-ehùrú onwe ya ma na-agakwa etu o kwesiri.

Dịka ọ na-akatọ etu ndị mmadụ si ekponye ahịhịa n’ebe mmiri si aga, Maazị Obidiegwu gbarụkwàrà ihu bànyere etu ụfọdụ ndị oji ego achụ ego nà ụfọdụ ụlọọrụ dị icheiche na steeti ahụ si emetọsị ọnọdụ gburugburu site n’iji ụnyí na ihe ọjọọ ndị ọzọ si n’ụlọọrụ ha apụ̀ta wee na-asụchisi ọwà mmiri ma na-emekwa ka ebe niile na-esì ísì.

Ọ sịkwa na nke ahụ bụ nnọọ nnukwu ihe iche aka mgba nye ọnọdụ ahụike mmadụ ndị na-ekùrú ihe ahụ n’imi nakwa ndị niile bi na gburugburu ahụ.

O kwuzịrị na gọọmenti steeti ahụ ga-enye onye, ụlọọrụ maọbụ ọdụahịa ọbụla akọchàsị̀ghị̀ ọwammiri dị na gburugburu ya maọbụ debe ya ọcha, ntaramahụhụ kwesiri ya.

Odimegwu mekwara ka a mara na onye ọbụla metọ̀rọ̀ gburugburu maọbụ daa iwu nchekwa gburugburu steeti ahụ ga-abụ onye a ga-anwụchikọ ma ma kpụpụ ya ụlọikpe ozigbo, ebe a ga-anọ jiri usoro iwu wee gwa ya ihe ọkụ ji ntị oke eme.

Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị Anambra na ndị nwere ebe obibi, ọdụahịa maọbụ ụlọọrụ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ amalitela ịkọ̀chasị̀ ọwa mmiri ha n’ịgbaso ntụziaka ahụ gọọmenti nyèrè.

N’ajụjụọnụ onye ntaakụkọ a bụ Izunna Okafor gbàrà ha n’otu n’otu, ụfọdụ ndị a hụrụ ka ha malitere ịkọchasị ọwammiri dị na gburugburu ha n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, nke gụnyere Ifenna Ibemesi, Dọkịta Onyeka Uzor, na Oriakụ Chinenye Efobi, kọwàrà ya dịka ihe kwesiri ekwesi ma kelee gọọmenti steeti Anambra maka etu o si agbasi mbọ ike ịhụ na ọwà mmiri na gburugburu steeti ahụ na-adị ọcha.

Ha kwere nkwà na ha kwụ gọọmenti na-azụ, ma kwuo na ha agaghị agharịpụ maọbụ dàá mbà ịga n’ihu na-akwàlite ezi atụmatụ adịmọcha ahụ na gburugburu ha, maka na onye dị ọcha na-anọdebe Chineke nso.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles