28.8 C
Nigeria
Saturday, April 27, 2024

Soludo Ewepùbèghị̀ Igwe Achebe Dịka Onyeisioche Otu Jikọtara Ndị Eze Ọdịnala Anambra — Kọmishọna

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Kọmishọna ahụ na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala, bụ Maazị Tonycollins Nwabunwanne akọwaala dịka akụkọ adịgboroja na okwu ụgha, bụ ebubo ahụ a na-ebo na Gọvanọ Chukwuma Soludo ewepụla Obi nke Onitsha, bụ Igwe Nnaemeka Alfred Achebe dịka Onyeisioche nke òtù ahụ jikọtara ndị eze ọdịnala n’ime steeti Anambra (nke a maara dịka ‘Anambra State Traditional Rulers Council, ASTRC).

Ọ dị ncheta na ozi bidoro fegharịba na mgbede ụbọchị Tuzdee, na-ekwu na Gọvanọ Soludo wepụrụ Igwe Achebe n’ọrụ ya dịka Onyeisioche ndị eze ọdịnala Anambra steeti.

Ya bụ ozi kwukwara na mwepù ahụ Gọvanọ Soludo wepụrụ Igwe Achebe dịka Onyeisioche ASTRC bụ n’ihi akwụkwọ ozi ahụ a gbara n’anwụ Eze ọdịnala ahụ dere na nsonso a maka nchụtù ahụ gọọmenti chụtùrù Igwe Damian Ezeani nke obodo Neni n’ọkwa na nsonso a.

Kaosiladị, mgbe onye ntaakụkọ a, bụ Izunna Okafor kpọtụrụ ya, Kọmishọna Nwabunwanne kọ̀wàrà ya bụ ozi na-efegharị dịka otu n’ime “akụkọ adịgboroja” nke ndị ‘asịrị gbakọ ute’ na-achọ nlebara anya, bụ ndị o kwuru, na ha na-enweta obi ụtọ n’iduhie na n’ịghọgbu ndị mmadụ ya na ịkpụtọ̀ na imebi aha ọchịchị steeti ahụ site n’ifesa ozi ụgha.

Dịka o si kwuo, ozi ahụ bụ akụkọ ụgha na-enweghị isi ma bụrụkwa nke e kwesịrị ileghara anya dịka asịrị si n’aka ndị achọghị ọganihu steeti ahụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles