28.1 C
Nigeria
Sunday, April 28, 2024

N’Anambra, A Gbapeela Ogige Ndị Uweojii Ọhụrụ, Tòó Ndị Ọrụ Nchekwa Maka Iweghàchite Udo na Steeti Ahụ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọtụtụ ndị selitere isi na ngalaba ọrụ nchekwa n’ime steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee wụchaa n’Ozubulu dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ekwusigo maka emume ịgbape ogige ndị uweojii a rụrụ ọhụrụ na ya bụ obodo site n’aka otu nwa amadi ọrụ obi ebere na-amasị.

Ya bụ agadaga ụlọọrụ uweojii bụ nke a rụrụ site n’aka onye hibere ma bụrụkwa onyeisioche òtù ‘Ebubechukwuzo Foundation’, bụ Chiifu Alloysuis Ikegwuonu; ma bụrụkwa nke nwegasịrị ngalaba ime ụlọọrụ dịgasị icheiche n’ime ya, tinyere ihe ndị ọzọ ga-enye aka ime ka ọrụ na-agawanye nke ọma n’ebe ahụ. Nwa amadi ahụ rụrụ ogige ụlọọrụ ahụ nyefèzị̀kwàrà ya n’aka ndị uweojii steeti Anambra, iji kwàlite ọrụ nchekwa na steeti ahụ.

N’okwu ya na mmeme ahụ, Komishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na Steeti Anambra, bụ Maazị Paully Onyeka kọ̀wàrà ya bụ ọrụ obiọma dịka nke dabàrà adabà n’òkù ahụ aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo na-akpọ banyere njikọaka n’etiti gọọmenti na ndị nkịtị iji kwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ n’izugbe.

Ọ gakwàrà n’ihu kpọpụ̀tasịa ihe dị icheiche ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nà ụmụafọ Ozubulu mepụtàgòrò n’ịkwàlìtè ezi ọnọdụ mmepe, bụkwa ndị o kwuru na ha arụọla okporoụzọ, rụọ ọdụahịa, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dịgasị icheiche.

N’okwu nke ya oge ọ na-agbape ya bụ ogige ọhụrụ, Onyeisi uweojii na Steeti Anambra, bụ CP Aderemi Adeoye kelere Gọvanọ Soludo maka nkwàdó dị icheiche ọ na-enye ndị uweojii na steeti ahụ iji rụọ ọrụ ha nke ọma, ọkachasị dịka o siri metụta ibu agha megide ndị omekome na steeti ahụ.

Ọ fọ̀kwàrà ekele n’ụkpa wee bunye nwa amadi ahụ rụrụ ya bụ ogige ọhụrụ, bụ Chiifu Ikegwuonu, maka ịhụta and ịghọta mkpà ọ dị ịdọnyere gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa ukwu iji memilaa ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ. O kpekwazịrị ka Chineke gọzie ma kwụghàchi ya bụ nwoke obiọma mmaji kwuru mmaji.

Banyere ọnọdụ nchekwa steeti Anambra dịka ọ dị taa, CP Adeoye, onye kpọpụ̀tasịrị̀ ụfọdụ mmeri ha nwetagoro n’ibu agha megide mpụ na arụrụala, kwùrù na ụlọọrụ ya na-etinyesi atụmatụ ike n’ọrụ ugbua ma na-agbasikwa mbọ ike ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa kawanye mma na steeti ahụ.

Na ntụnye nke ya, ya bụ isi a hụrụ kwaba okpu na mmemme ahụ, bụ onye rụrụ ya bụ ogige, Chiifu Ikegwuonu, kwuru na ebumnobi ya banyere nke ahụ bụ iji nye aka ma tụnye ụtụ nke ha n’ịkwàlìtè ezi ọnọdụ nchekwa obodo ya, steeti Anambra, na ala Nigeria n’izugbe.

Ya bụ oke mmemme dọ̀tàkwàrà ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na mpaghara ebe ahụ, ndị bịara iji anya ha gbara ekeresimesi banyere etu o siri zoo ma gbachaa.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles