35.5 C
Nigeria
Thursday, May 9, 2024

Otu Ọganiru Umunri Emeela Emume Ụbọchị Omenala Igbo

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo pụtàra ìhè na nsonso a n’Enugwu-Agidi dị n’okpuruọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambra, dịka òtù a mààra dịka Ọganiru Umunri chịkọbàra mmemme Ụbọchị Omenala Igbo nke afọ 2023.

Oke mmemme ahụ nke bụ nke a nọrọ na ya wee kpọọ òkù banyere itute, ichekwaba na ịkwàlite asụsụ, omenala, ọdịnala na njirimara Ndị Igbo n’ụwa gbaa gbùrùgbúrù.

A nọkwàrà na ya bụ mmemme wee nwee nrụrịtaụka gbasaara omenala Igbo n’etiti ụlọakwụkwọ ‘Comprehensive Science and Technical School, Nawfia’ na ụlọakwụkwọ ‘Okutalukwe Community Secondary School Enugwu-Ukwu’, ya na ụmụakwụkwọ dị icheiche sonyere na mmemme, bụkwa asọmpi e mere naanị n’asụsụ Igbo.

Ka ọ na-akọwàpụta ihe bànyere mmemme ahụ, Onyeisioche otu nlekọta Ọganiru Umunri, bụ Injinia Sam Oraegbunam mere ka a mara na ha na-esite na ya bụ ihe mmemme wee na-echetara ụmụ agbụrụ Nri akụkọ ntọala ha, ma na-atụnyekwa ụtụ n’ịkwàlite njirimara na omenala Igbo.

Ọ kwàrà arịrị na ọtụtụ omenala Ndị Igbo, ọ kachasị asụsụ ha, na-anwụnyụzị anya ugbua, nke mezịrị o jiri dị mkpa na onye ọbụla bụ ezi nwa afọ Igbo ga-atụnye ụtụ ma tinye aka n’ọrụ, iji zọpụta ma hụ na ya bụ asụsụ efùghị dịka òtù mba ụwa United Nations Educational Scientific, and Cultural Organization (UNESCO) siri buo n’amụma n’afọ 2012.

Na ntụnye nke ya, nwa amadi ahụ na-anọchite anya mpaghara Anambra Etiti n’ụlọ omeiwu Sineti, bụ Maazị Victor Umeh kọwàra asụsụ na omenala dịka ótù n’ime ihe kachara dị mkpa na ndụ mmadụ na àgbụrụ ọbụla; ma rịọkwazie ndị nne na nna ka ha jisie ike na-akụziri ụmụ ha asụsụ na omenala Igbo oge ọbụla, na-agbanyèghị mbà maọbụ obodo ha bì.

Sinetọ Umeh rịọkwazịrị ndị òtu Igbo dị iche iche, ma ndị nọ n’ala Nigeria maọbụ mba ofesi ka ha na-echeta ebe ha sì, ma na-atụnyekwa ụtụ nke ha na mgbe na mgbe n’ịkwàlìtè asụsụ na omenala nna ha, n’ihi na ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya ma e tete ụra otu ụbọchị o wee bụrụ na asụsụ Igbo adịghịzị, maọbụ na ọ nwụọla kpamkpam dịka ụfọdụ asụsụ ọdịnala ndị ọzọ dị icheiche siri laa mmụọ.

Na mbụ na nkụzi ya na mmemme ahụ, Ọkammụta Emeka Nwankwo mere ka a mara na ọ bụ Nri bu isi ala Igbo, kpọpụ̀tasịa akparamagwa, omenala, obibindụ, na ihe dị icheiche e jiri mara ndị Igbo.

Ọ kpọpụ̀tàsị̀kwara uru dị icheiche jupụ̀tara n’asụsụ, njirimara na omenala Igbo, ma kpọọ òkù ka e jigidesie ihe ndị ahụ ihe, na-akwàdó ma na-akwalite ha, ka ha ghara ifunahị̀ ndị Igbo. Ọ gakwazịrị n’ihu kelee ndị haziri ụdị ọmarịcha mmemme ahụ, gbàá ha ume ka ha jide ka ha ji.

A nọrọ na mmemme ahụ wee mee ụfọdụ ihe ngosi ma dị icheiche. A nọkwàrà na ya wee tụọ ndụ mmanụ site n’iri ụdị nri dị icheiche e ji mara ndị Igbo, tinyere mmanya ngwọ na nkwụ elu jụrụ oyi e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.

 

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles