23.5 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

Ndị Awka Etoola Soludo Maka Ọrụ Okporoụzọ, Jaa Ya Ike

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụmụafọ obodo Okpuno dị n’okpuruọchịchị ime obodo Awka South nke steeti Anambra etoola aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo maka ezi ọrụ ya na ịgba mbọ ya n’ịkwàlitè ọnọdụ mmepe steeti ahụ, bụkwa nke o gosipụ̀tàgòrò site n’ọrụ ọma dị icheiche ọ gbapegoro, ọkachasị ọrụ okporoụzọ na ọrụ ndị ọzọ o ji n’aka na mpaghara ebe dị icheiche na gburugburu Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Ụfọdụ ndị obodo ahụ, nke gụnyere Maazị Chukwudi Okafor, Chukwuemeka Obidimma na Ejike Nwuba kwupụtàrà ozi ekele ha ahụ oge ndị ntaakụkọ gbàrà ha ajụjụọnụ na nsonso banyere etu ọrụ si agawanye n’ihu n’ogologo Okporoụzọ UNIZIK-Obi Okoli-Y Junction-Goodwill Junction-Ifite-Isuanaocha, bụ otu n’ime okporoụzọ ọchịchị steeti ahụ malitere ọrụ na ya na nsonso a ma na-arụkwa ya n’ike.

Ha tòrò Gọvanọ Soludo dịka nwoke nwere ezi ebumnobi inye ndị Anambra ezi ọnọdụ okporoụzọ bụ ịgba, dịka o kwèrè na nkwà oge ọ na-achụ nta nkwàdó, ma bụrụkwa nke ọ malitegoro imezupute.

Ha kọrọ akụkọ banyere ihe nhịahụ na ihe iche aka mgba dị icheiche ha na-agabiga n’okporoụzọ ahụ n’oge mbụ, ọkachasị n’oge udummiri; ma kwupụta olileanya ha nwere na ihe ndị ahụ ga-abụzị akụkọ mgbe ochie ma ọ bụrụ na a rụchaa ya bụ ụzọ, tinyéré mmepe na ọtụtụ uru ndị ọzọ nke ahụ ga-eweta na mpaghara ahụ.

Ha kèlèrè Gọvanọ Soludo maka mgbataọsọ ya, ma rịọ ya ka o jisie ike n’ọrụ, ọbụladị dịka ha kwèkwàrà nkwà inye ya na ọchịchị ya ezi nkwàdó zuru okè, iji chịrị steeti ahụ ruo n’ala e kwèrè na nkwà.

Na mbụ n’okwu nke ya, onye nlekọta ọrụ ngo ahụ nyèrè nkọwa mere ka a màrà na ya bụ okporoụzọ ga-adị njikere maka ụgbọala ịgba na ya n’oge adịghị anya.

O nyekwazị̀rị̀ nkọwa banyere otú ọrụ ahụ si aga, ogoogo ọ nọ na ya ugbua, na ihe ndị nke fọrọ afọ; mekwazie ka a mara na ndị bi na mpaghara ebe ahụ ga-agba na ya bụ ọmarịcha okporoụzọ dị larịị n’oge adịghị ma a rụchaa ya. O kwukwara na oké mmiri ozuzo so n’ihe na-adọghachi aka elekere azụ n’okporoụzọ ahụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles