33.3 C
Nigeria
Saturday, April 27, 2024

N’Anambra, Ndị Omekome Egbuola Di na Nwunye, Dọhàpụ̀ Ozu Ha n’Ime Ụgbọala

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

A hụla ozu mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ di na nwunye na-agba ọbara n’otu ebe dịpụrụ adịpụ na steeti Anambra.

Ndị ahụ nwụrụ anwụ, ndị e kwenyere na ọ bụ ndị omekome a na-amabeghị ndị ha bụ gburu ha, bụ ndị a hụrụ ozu ha n’ebe a na-etinye ibu n’ụgbọala ha nwere ákàrà EE-621-EU.

Dịka onyonyo a na-agbasa ugbua n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ siri kwuo, ụgbọala Toyota Corolla oji ahụ bụ nke ndị na-agafe agafe hụrụ ebe a gbahapụrụ ya n’akụkụ okporoụzọ, n’akụkụ Njikọụzọ Tempo, na mpaghara Umunya nke ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha n’isi ụtụtụ Wenezde, abalị iri na anọ nke ọnwa Jenụwarị.

E kwukwara na ọnụụzọ ụgbọala ahụ mepesiri emepe, ọ nweghịkwa onye nọ n’ime ya; ma mgbe ha ruru ebe ahụ ụgbọala ahụ dị, ha hụrụ ozu abụọ a dọbara n’ime ya.

A hụkwara ọbara gbakọtara n’okpuru ụgbọala ahụ, na-egosi na o nwere ike ịbụ na e gburu ha n’ụzọ ike.

N’okwu ya banyere nke ahụ oge onye ntaakụkọ a, bụ Izunna Okafor, kpọtụụrụ ya maka nzaghachi ya, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Tochukwu gbàrà akaebe na ihe ahụ mèrè n’eziokwu.

O kwukwara na ndị ọrụ uweojii na Mpaghara Oyi ebupụtala ma tinye ozu abụọ ahụ n’ụlọ nchekwa ozu, ebe nyocha malitegokwara iji chọpụta ihe mere ha.

Dịka o siri kwuo: “Ndị ọrụ uweojii na ngalaba Oyi enwetala ozu abụọ enweghị ndụ a gbahapụrụ n’ime ụgbọala n’akụkụ okporoụzọ Enugwu—Ọnitsha Expressway. E dobela ozu ndị ahụ n’ụlọ ebe a na-edebe ozu ebe nyocha bidogokwara.

“Ozi e nwetegoro na-akọwa na e gburu ndị ahụ egbu ma gbahapụ ha n’ụgbọala Corolla oji nwere akara akara Lagos AAA 621 EU. A ga-ekwupụtakwu nkọwa ndị ọzọ, biko.”

Lee onyonyo ebe ihe ahụ mere:

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles