29 C
Nigeria
Saturday, April 27, 2024

Mmemme Iri Ji Ọhụụ Dịka Omenala Igbo

 

Izunna Okafor dere edemede a

Iri ji ọhụụ abụghịzị okwu ọhụụ na ntị nwa ọbụla gbara ahọ n’ala Igbo. Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị na-enye ya nkwọwa dị icheiche ma na-ahụtakwa ya dịka nke maọbụ nke ọzọ.

Kaosiladị, ọ na-abụ e gburìsie anụ enyi, o kwere obubu, maka na ọ bụrụ na ọ̀kpụ́aja akọwaghị ihe ọ kpụrụ, òfèkè nwere ike ịkpọ nwansu amụ dike. Ọ bụ nke a mere o jiri dị mkpa ịkọwa ihe ‘Iri Ji Ọhụụ’ bụ n’ala Igbo, ọkachasị dịka otu n’ime omenala na nnukwu mmemme e jiri mara ndị Igbo.

Ihe sūrū, à gbábá ya, ọ bụghị egwu, ọ bụrụ ọsọ.

N’ịgbasò nke ahụ, iri ji ọhụụ bụ otu n’ime omenala dị icheiche e ji mara ndị Igbo n’ụwa gbaa gburugburu. Ọ bụ mmemme omenahọ ma bụrụkwa nke ezi nwaafọ Igbo ọbụla na-esonyesi ike na ya.

Mmemme iri ji ọhụụ bụ oge e ji enye Chineke ekele n’ihi onyinye ji, ya na nchebe Ya na ndụ O nyere ụmụ mmadụ wee ruo n’oge owuwe ihe ubi; maka na ọ na-abụ a kọ̀ọ́, gwute, a sị na ahọ amagbuo onwe ya. Ọ bụkwa oge a ka ndị Igbo ji akwanyere ji ugwu ruuru ya dịka eze nke ihe niile a kọrọ n’ubi, dịka akụkọ okike siri kọọ, bụkwa nke mere ka a mara na ọ bụ Agbara bụ mmụọ nwe ji.

Ọzọ bụ na mmemme iri ji ọhụụ bụ oge ndị Igbo ji ezu ike ma na-elekwa onwe ha ọrụ maka ọrụ ugbo ahọ ahụ.

N’obodo ala Igbo niile, ịkọ ọrụ ugbo bụ ihe ọtụtụ mmadụ jiri mere akaọrụ; ọ bụghị naanị n’ihi nri maọbụ ego si na ya apụta, kama n’ihi na ọ bụ ihe ejirimara ndị Igbo, maka na ọ bụrụ na Ịkpọ Ngwèrè emeghị ihe o jiri bụrụ Ịkpọ Ngwèrè, ụmụaka ewere ya mee anụ ọkọchị na udummiri.

Mgbe ndị Igbo kụnyesikwara mkpụrụ ọkụkụ dị icheiche dịka ji, ede, akpụ, ọka, ọ̀nà, adụ̀, ụgụ, ọkwụrụ, ụgbọgụrụ na ihe ndị ọzọ n’ubi; ha na-atụ anya na ha ga-enweta nke karịrị nke ahụ n’ahọ ọzọ, maka na ala bụ ọnara ọzụọ. Oge nke ahụ ruzịrị, ihe ndị ahụ a kọrọ n’ubi tochaa, ndị Igbo n’obodo ha dị icheiche na-akpọ oriri n’isi ótù n’ime ha, nke bụ eze ha, tupu onye ọbụla n’obodo ahụ amalite ribe ya.

N’ụfọdụ obodo, dịka Enugwu-Ukwu nke dị n’okpuruọchịchị Njikọka na steeti Anambra, ha na-ebu ụzọ mechaa otu omenala pụrụ iche a kpọrọ mmemme ‘Ịkpọ Ji’, bụ nke ha ga-emerịrị tupu a malite ibubata maọbụ ire ji ọhụụ n’ahịa obodo ahụ bụ Nkwọ Enugwu-Ukwu. Ha mechazie nke ahụ, ha ewee mezie mmemme iri ji ọhụụ kpọmkwem.

Ndị obodo ndị ọzọ nwegasịrị ihe dị icheiche ha na-akpọ ya n’obodo ha, bụ nke dabarà n’usoro ya bụ mmemme. Iji maa atụ, a bịa na steeti Anambra, e nwere ndị na-akpọ ya Ìhèjiọkụ, Imo Ọka (Awka), Afịọlụ (Nnewi), Iri Ji (Ebenator) Afịa Ọlụ (Nnobi), Ịwa ji, Njọkụ, Ịgba Ọfala, Ilo Mmụọ (Ogidi), tinyere ndị ọzọ.

Tupuu ụbọchị a ga-eri ji ọhụụ kpọmkwem, a na-aga n’ọba, tọsịa ma wepùsie ji ochie niile dị n’ọba ji, iji wee nabata ji ọhụụ na iji kwanyere ya ùgwù dịka onye ọhụụ ọ bụ, maka na oke ji na abàlà anaghị azọ ihu ọba.

Ụbọchị ahụ a na-eri ji ọhụụ kpọmkwem na-abụ oge igosipụta ịma mma nke ọnatarachi dị icheiche ndị Igbo nwere, nà ihe ngosi ndị ọzọ Chukwu jiri gọzie ha.

A na-agba ụdị egwu ọdịnala dị icheiche, dịka uhie (nke ọ bụ ndi ichie maọbụ ndị chiri echichi na-agba), egwu mmọnwụ, ekpo, ọgbamgbada, égwùagụ, ọpịakamkpàrá, tinyere ihe ndị ọzọ dị icheiche na-ekpozịkwa elu ụbọchị ahụ, iji mee ndị mmadụ obiụtọ, ọkachasị site n’ịchụ ha ọsọ, ịgba egwu, ime anwansì, na ihe ndị ọzọ.

Ụfọdụ na-agbakwazị mgba ka ha mebe nke ha, bụ oge ụmụokorobịa ji esì ọkụkpụ, ka a mara onye ka eriju afọ maọbụ onye ákwà kàrà si ike n’ukwu, maka na ọ na-abụ dike zùte dike ibe ya n’ụzọ, a mara akanwụ na ụtaba, nke na-akpọlite uzere.

Ọ na-abụkarị eze ọdịnala obodo ahụ na-agọ ọfọ, kelee Chukwu, kpee ekpere ngọzi, udo na ọganihu n’isi obodo ahụ na ụmụafọ ya, ma wakawa ji kpọmkwem, tụpụrụ ndị mbụ na ndị egede ma suru nke ya rie tupu e bido ikesà ya ma ọ bụrụ na Onoowu na ndị ichie ya suruchaa nke ha.

A na-anọkwa na mmemme ahụ oge ụfọdụ wee nye ihe nrite maọbụ onyinye nkwanyeùgwù nyégárá onye ji o gwutere n’ugbo ya kachara wee buo ibu. A na-enyekwa ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ mepụtagoro ihe dara ụda n’obodo nkwanyeùgwù ụbọchị a na-eri ji ọhụrụ n’ụfọdụ obodo.

Oge ụfọdụ, onye kacha bụrụ okenye n’obodo na-anọ na mmemme iri ji ọhụụ wee kọọrọ ndị obodo ahụ ọtụtụ akụkọ miri emi dịgasị añaa gbasara obodo ahụ, dịka akụkọ ntọala maọbụ akụkọ okike (history) nke obodo ahụ, ebe ha siri bịa, nakwa ọtụtụ akụkọ ọdịnala ndị ọzọ miri èmì.

Nke kacha nke bụ na mmemme iri ji ọhụụ na-abụkwazị oge oriri na ọñụñụ pụrụ iche maka na erimeri na-abụ atụrụ taba ụbọchị ahụ; onye ọbụla na-añụkwa ọgwụ afọ ma ghebe afọ ya oghe tupuu o si n’ụlọ ya pụtaba.

Nkwụ, nke gụnyere mmanya ngwọ, nkwụ elu, mmanya karama, ji a hụrụ ahụ ma were ụtazị mara abụba, ose, ụkpaka, ogiri na mmanụ na-amụ mịrịmịrị chọọ ya mma socha n’oriri a na-eri ụbọchị ahụ nà ihe ndị na-eme ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.

Ihe ndị a niile bụ ihe na-eweta obi añụrị na obi ụtọ na ya bụ mmemme omenahọ, ka a ga-asị oge ya agwụla agwụ. Ụfọdụ obodo na-eme mmemme iri ji ọhụụ n’ọnwa nke asatọ, ebe ụfọdụ na-eme nke ha n’ọnwa nke iteghete, maka na ọ bụ mgbe onye jiri teta, ọ bụrụ ụtụtụ ya.

N’ọtụtụ obodo, ụfọdụ ndị aka ji akụ na ndị selitere isi n’obodo na-emekwa mmemme ịwa ji maọbụ iri ji nke ha na be ha dị icheiche, bụkwa nke onye na-eme ya na-akpọkù ndị enyi ya, ndị nwadiala, ndị ikwu na ibe, na ndị ọzọ metụtara ya ka ha bịa sonyere ya ụbọchị ahụ. Mana tupu a malite ime nke ahụ, obodo ga-ebugodi ụzọ richaa ji ọhụụ dịka obodo, maka na ọ bụ ọbagwò na-efé ọdụ, ọbụghị ọdụ na-efé ọbagwò. Otu ọ dị, ihe ndị a niile bụ ihe obi ụtọ na ihe oriri na ọñụñụ.

N’agbanyeghị ihe ndị a niile, n’elu uwa ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụtazị iri ji ọhụụ dịka ikpere arụsị, ebe ndị obodo ụfọdụ mechigoro ya kpamkpam n’ihi na ha na-ahụta ndị na-eme ya dịka ndị na-agọ mmụọ na ndị nọ n’ìsì.

Ọtụtụ ndị nne na nna anaghịzịkwa ekwe ka ụmụ ha sònyé na mmemme iri ji ọhụụ n’obodo ha, maọbụ rie ihe ọbụla e siri ebe ahụ, n’ihi na ha na-ahụta ya dịka ihe a gọọrọ arụsị, maọbụ ihe ndị ọgọ mmụọ. Ha chezọrọ na nke ahụ so n’otu ụzọ pụtakarịchara ihe e si akwalite njirimara na omenala ndị Igbo, bụrụ oge ndị obodo ji anọkọ ọnụ dịka ụmụnne wee kpaa maka ọdịmma, udo na ọganihu nke obodo ha, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ ọ na-ewèta.

Ihe kacha egbu njirimara na omenala ndị Igbo bụ ịgbakụta ha azụ site n’aka ụfọdụ ụmụafọ Igbo bụ ndị na-eche na ha hụrụ ụzọ, jekarịa Poopù n’ụka maọbụ na ha na-ahụzị Chineke anya kwa ụbọchị.

N’ebe ndị dị otu a nọ, ihe niile gbasaara ọdịnala na omenala Igbo bụzị ihe ọchịchịrị, ihe nzuzu na ihe ndị ọgọ mmụọ. Nke ahụ wee bụrụnnọọ echiche onye nzuzu sị na ya dara n’elu, na a mụghị ya amụ. Ụkpala na-ere ọkụ ọ sị na ọ na-aha mmanụ. Ihe ndị bụ nke ndị Igbo wee na-efunahịzị ha maka na ha bụ ndị nwere ogiri amaghịzị uru ogiri bara n’ofe, dịka ofeke amaghị uru àkpá agwụ bààrà ézè dibịa.

Otu ọ dị, ide mmiri sị ndị na-akpara ala nna ya, ha jisie ike, na nsogbu adịghị, kama na mgbe nwanne ya nwaanyị bụ udummiri bàtàrà ebe ọ gara, o were aka ya kọwaa ebe oke siri dị.

Ndị Igbo, chigharịanụ ghọta na nke anyị bụ nke anyị, na ọ bụkwa ebe onye bi ka ọ na-awachi. Ka anyị kpọọ ihe anyị ihe. Ka anyị jisie ike n’ịkwalite na n’isonye n’omenala dị icheiche e jiri mara ndị Igbo maka na ọ na-abụ nkwụ daa n’ala, nwaanyị eñe ya uhie, rịa ya elu. A sị na ọ na-abụ onye kpọọ ọba ya ọkpọkọrọ, agbatobi ewere ya kpoo ahịha, ma sịkwa na ọ na-abụ onye sọnyụọ ọkụ ya, ọ nọrọ n’isi.

Onye ọbụla tìnyé aka ma gbasie mbọ ike otu o nwèrè ike n’ụdị nke ya iji kwàlite iri ji ọhụụ n’ala Igbo, ya na omenala, ọdịnala na ihe ndị ọzọ e jiri mara Igbo.

Ndị Igbo, ka anyị cheta na ọ bụkwanụ otu onye siri pịa akụ ya ka ọ ga-esi debe ọnụ; maka na, tigbuo mmụọ, tigbuo mmadụ, udele ka ga-ejupùtakwa n’eluigwe.

Omenala Igbo ga-adịrịrị.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles