26.8 C
Nigeria
Saturday, June 28, 2025




Gwogwogwongwo: Mike Ejegha Anwụọla — Ihe Kpatara Ọnwụ Ya

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụgwọ onye ụwa ji chi ya bụ ịza ya òkù mgbe ọ kpọrọ ya, maka na ọ na-abụ ụkwa ruo oge ya, ọ dàá.

N’ịgbaso nke a, otu onye egwu ekpiri a ma ama n’ala Nigeria nà mba ụwa gbaa, bụ Maazị Mike Ejeagha, anwụọla.

Mike Ejeagha, onye a na-akpọkarị “Gentleman Mike Ejeagha”, nwụrụ n’ihe dịka elekere asatọ nke abalị ụbọchị Fraịdee, ka ọ gbachara afọ iri iteghete na ise.

Dịka ozi si n’aka diọkpara ya, bụ Emma Ejeagha, siri kọwaa, ya bụ onye egwu ekpiri nwụ̀rụ̀ n’ụlọọgwụ ‘32 Garrison Hospital’ dị n’Enugu ka ọ rị̀àchàrà ọrịa kánsà ihe dị ka afọ iri na isii.

 

Mike Ejeagha bụ onye a mụrụ ya n’abalị anọ nke ọnwa Eprel 1930, n’obodo Imezi Owa dị na steeti Enugu. Akaraka ya n’iti egwu chawapụ̀tàrà n’agbata afọ 1960 na 1980 wee gbagotebezie.

Ya bụ agụ nwoke bụkwa onye a mà ama n’iji egwu ya were ákwàlite akụkọ ifo, na asụsụ na omenala Igbo, ma bụrụkwa onye egwu ya jupụ̀tàrà n’mamihe nà nkụzi, nke gbadoro ụkwụ n’ihe na-eme n’ụwa, ma n’oge mbụ ma n’oge ugbua. Ọ bụkwa onye na-akpọ ụbọ akwara.

Ụfọdụ egwu dị icheiche o kụrùrù gụnyere Omekagu, Uwa Mgbede Ka Mma, Ka E Si Ree Onyeisi Oche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Ejeagha chawapụ̀tàkwàrà ọzọ n’ụzọ pụrụ iche n’afọ 2024, mgbe e jichara otu egwu ya o tiri n’afọ 1983, bụ “Ka E Si Ree Onyeisi Oche” wee mee ihe egwuregwu asọmpi ịgba egwu (dance challenge) n’usoro nzikọrịta ozi ọgbaraọhụrụ (social media), nke e siri na ya wee wepụta “Gwogwogwongwo” dịka okwu mkparịamụ na okwu a kpụ n’ọnụ, bụkwa nke ka na-ewu èwù wee ruo taa.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles