28.1 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

FEDPOLY Oko Anabatala Ụmụakwụkwọ Ọhụrụ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka mahadum ‘Federal Polytechnic, Oko’ dị n’okpuruọchịchị ime obodo Orumba North nke Steeti Anambra, merùbèrè emume ịnabata ụmụakwụkwọ batara ọhụrụ n’ụlọakwụkwọ ahụ.

Oke mmemme nnabata ụmụakwụkwọ ahụ bụ agba nke iri atọ na anọ (39th), ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kọwaara ụmụakwụkwọ ahụ ihe dị icheiche ha kwesiri ịma banyere ụlọakwụkwọ ahụ, ma dukwa ha n’iyi ka ha wee na-erube isi nye iwu na-achị ụlọakwụkwọ ahụ.

N’okwu mmalite ya n’ebe ahụ, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Dọkịta Francisca Nwafulugo jiri obi ụtọ wee nabata ụmụakwụkwọ ahụ batara ọhụrụ na ya bụ mahadum ahụ, ma chètara ha na ọ bụ mmasị Chineke na ha ga-abụ ụmụakwụkwọ nọ na-agụ akwụkwọ ebe ahụ n’oge dịka oge a.

Ọ kọwara mahadum ahụ dịka otu n’ime dị elu kachasị mma n’ụwa gbaa gburugburu, ma bụrụkwa nke nwere ngalaba ọmụmụ ihe dị icheiche na-eweta ụsa nye nsogbu dị icheiche na-échéré mba ụwa aka mgba.

Dọkịta Nwafulugo kpọkuru ụmụakwụkwọ ahụ mahadum ahụ, ọkachasị ndị nke batara ọhụrụ, ka ha dị uchu n’agụmakwụkwọ ha ma gụsie akwụkwọ ike, iji nwee ezi mpụtara ma bụrụ ndị gọọmentị na ụlọọrụ dị iche iche ga na-achọgharị ka e wee ha n’ọrụ, ngwangwa ha gụchara akwụkwọ.

Ọ gara n’ihu tòó ụmụakwụkwọ ahụ maka ọgụgụisi ha, ma kpọkuo ha ka ha bụrụ ndị na-aña ntị nke ọma, na-erube isi na ndụmọdụ, ma na-agbasòkwa ntụziaka, ka ha wee ghara ịkwa ngarammara ma e mechaa.

Ọ gwakwara ha ka ha zèéré ihe ọbụla bụ akparamagwa ọjọọ, dịka ịba n’otu nzuzo, ígwù ojoro n’ule, izu ohi, ịgba akwụna, ime enyi ọjọọ, ịtụ asị na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ, bụ nke nwere ike imebi aha ha maọbụ kpụtọọ ùgwù ha; ọbụna dịka ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-ekpesikwa ekpere ike, ma na-achụsòkwa ezi mpụtàrà. O chetaara ha na ọ bụ akwụkwọ ka nne na nna ha zitere ha ka ha bịa gụọ n’ebe ahụ, ya na ịmụ̀tà ihe dị icheiche ga-enyere ha aka ịba uru na ndụmọdụ.

Ya bụ onyeisi mahadum jikwazị̀ ohere ahụ kelee ụmụakwụkwọ ahụ maka mbàta ha na mahadum ahụ, ma nyekwazie ha owuweanya na ụlọakwụkwọ ahụ ga-aga n’ihu ịkwalite ọdịmma ha na ọnọdụ mmụta ha ogologo oge niile ha ga-anọ na mahadum ahụ.

Na nzaghachi ya n’aha ndị òtù ya oge a gbara ya ajụjụọnụ, otu onye n’ime ụmụakwụkwọ ahụ batara ọhụrụ, bụ Nwaada Ebere Umeononihu, kwuru na mmemme ahụ emepeela anya ha ka ha mụtakwuo ọtụtụ ihe dị icheiche ha kwesiri ịma banyere mahadum ahụ na agụmakwụkwọ ha n’ebe ahụ. Dịka ọ na-ekele ndị haziri ihe mmemme, o kwèzịrị nkwa na ọ ga-agụsi akwụkwọ ya ike iji wee nwee ezi mpụtara mgbe ọ ga-achịkọta agụmakwụkwọ ya n’ebe ahụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles