36.7 C
Nigeria
Sunday, April 28, 2024

Agụụ Dị n’Obodo

 

Izunna Okafor dere abụ a

Chịịị chịịị ka ọ na-atà n’afọ
Nwịị nwịị ka ọ na-amị n’ọkpụkpụ
Agụụ bụ aha ya
Ị kpọọ ụganị ọ za gị

Agụụ bụ echete ebeme
O nweghị nne, nke o ji enwe nna
O nweghịkwa ikwu na ibe
Agụụ bụ aha ya

Agụụ amaghị nwoke na nwaanyị
Ọ haghịkwà ụmụntakịrị aka
Mere e ji akpọ ya otii nwata n’ihu nne ya
Agụụ bụ aha ya

Agụụ anaghị asọ anya
Agụụ naghị eme ihere
Agụụ anaghị asị ndo
Agụụ bụ aha ya

Ọrọbọ na-atụ ya égwù
Atịngà na-agbara ya ọsọ
Dike akpụ obi na-asọkwa ya asọ
Agụụ bụ aha ya

Agụụ enweghị ényì
Agụụ enweghị onye iro
Mana ebe ọbụla ọ bàtàrà
a chọọrọ ya ihe ọ na-eri
Agụụ bụ aha ya

I mete ya enyi, ọ ka njọ
Ị tụ ya iro, ọ nyụọ gị anya
Ọ bụ orufọrọ be onye
Agụụ bụ aha ya

Agụụ na-amịkpọ mmadụ
Na-eme nwata okenye n’akaghị aka
Ma ya onwe ya adịghị aka nka
Agụụ bụ aha ya

Agụụ bụ ọnwụnwà
Agụụ na-ete mmadụ ure n’ọha
Agụụ bụkwa ọranyere nwata anya n’ogwu
Agụụ bụ aha ya.

Ọ na-adị ka ọnwụ na-egbu ọhà
Mana ọnwụ ekweghị ewere ya
Kemgbe okike ụwa ka o siri kpaba ike
Agụụ bụ aha ya

Kwashiọkọ bụ afọ ime ya
Ọnya afọ bụ òghùghù ọmụmụ nwa
N’ala ili ka ọ na-akpdobe ike
Agụụ bụ aha ya

Agụụ eriela isi ọtụtụ mmadụ
Mana afọ ekweghị eju ya
Agụụ bụ nke e mere jụọ oyi
Agụụ bụ aha ya

Agụụ dị njọ
Agụụ dị n’ala anyị
Agụụ ahịala ụmụ mmadụ ọnụ
Agụụ egbuo ndị a
N’eziokwu, agụụ dị n’obodo
Agụụ…

© Izunna Okafor

*******************************

Maka Onye Dere Abụ A:

Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenatọr dị n’okpuruọchịchị ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, bụrụ onye ntaakụkọ na onye ikwàlite asụsụ Igbo na-amasị nke ukwuu.

O deela ọtụtụ akwụkwọ na edemede e biputagoro na mpaghara ebe dị icheiche n’ụwa gbaa gburugburu, ma n’asụsụ Igbo, ma n’asụsụ Bekee.

Dịka onye edemede na onye ntaakụkọ, o nwetala ntúrúùgò na nkwanyeùgwù karịrị iri atọ n’ọnụọgụgụ. Nturuùgò na nkwanyeùgwù ya gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016;  Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Izunna na-ede akwụkwọ nà edemede n’asụsụ Igbo na n’asụsụ Bekee nke ọma.

Ọ bụkwa onyeisi otu jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n’ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

 

 

 

 

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles