39.5 C
Nigeria
Sunday, April 28, 2024

Osote Gọvanọ Ibezim Agbapeela Atụmatụ Inye Ndị Ntorobịa Ọzụzụ n’Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

N’ịga n’ihu na mbọ ọ na-agba ibelata mmetụta nke ajọ ọnọdụ akụnụba dị ugbua n’ala Nigeria, Dọkịta Onyekachukwu Ibezim, Osote aka na-achị steeti Anambra, azọpụ̀lá ụkwụ n’ịkwalite ndị ntorobịa site n’inye ha ọzụzụ ọrụaka dị icheiche.

Emume inye ọzụzụ a bụ nke a haziri maka ndị ntorobịa Mbaukwu na ụmụakwụkwọ, ma bụrụkwa nke haziri n’okpuru nkwado òtù ‘Onyekachukwu Gilbert and Chizoba Christina Ibezim Foundation’.

Ya bụ ọzụzụ nke e mere mmemme mgbape ya n’ụlọakwụkwọ ‘Renaissance Modern Polytechnic Mbaukwu’, dị n’okpuruọchịchị ime obodo Awka South nke steeti Anambra, bụ nke a ga-esite na ya wee kụziere ndị sonyere na ya ọrụ aka dị icheiche ga-enyere ha aka ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha.

Òtù ‘Onyekachukwu Gilbert and Chizoba Christina Ibezim Foundation’ bụ òtù nnọ̀rọ́onwe e hibere n’aha nne na nna Osote aka na-achị steeti Anambra, ma bụrụkwa otu na-abagide n’ụdị ọrụ nkwàdo, ọrụ mgbataọsọ, na ọrụ obi ebere dị icheiche.

N’okwu ya n’ebe ahụ oge ọ na-agbape atụmatụ onye ọzụzụ ahụ, onye hibere òtù ahụ n’aha nne na nna ya lagoro mmụọ, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim kọwapụ̀tàrà mkpa ọzụzụ ahụ dị na uru dị icheiche ọ ga-eweta; ma kwukwa na nke ahụ ga-enye aka ịkwàdò mmezupụ̀ta ezi ebumnobi ahụ ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo nwere n’ebe ndị ntorobịa steeti ahụ nọ.

Dịka o nyechara nkọwa banyere ọmarịcha atụmatụ ahụ nà ihe kpaliri mmụọ ya o jiri hibe ya; Dọkịta Ibezim nyekwazị̀rị̀ ndị niile na-esonye n’ọmụmụ ọrụaka ahụ ndụmọdụ ka ha gbado anya nke ọma gbasie mbọ ike ịmụ̀tà ihe dị icheiche a ga-akụziri ya n’ebe ahụ ma jirikwa ha a mepụta ihe, iji baara onwe ha, obodo ha na gọọmenti uru. Ọ gwakwara ha gbaa mbọ ka ha bụrụ ndị na-ekewàpụta ohere ọrụ ma na-ewèkwazị ndị mmadụ n’ọrụ n’ime oge ha mụchara ọrụaka ahụ, maka na o kwesiri onye a gọziri nọ̀zite, ọ̀ gọzie ndị ọzọ.

N’okwu nke ha n’otu n’otu, ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n’obodo ahụ, nke gụnyere Maazị Peter Ezeilo, Maazị Ekene Onyebuchi, na Maazị Chijioke Okeke, kèlèrè Dọkịta Ibezim nà òtù ahụ maka mmasị ha isi n’ụdị ọmarịcha atụmatụ dị etu ahụ kwalite ọdịmma ndị ntorobịa ma mee ha ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha.

Dịka ha na-ekwupụ̀ta olileanya ha nwere banyere etu atụmatụ ahụ ga-esi kpọpụ akọnuche ndị ntorobịa n’ihe ọjọọ, ma kwàlite mmepe obodo; ha kwezịrị nkwà ịga n’ihu na-akwalite ụdị ezi atụmatụ dị etu ahụ; ọbụna dịka ha gwara ndị ntorobịa ahụ, ka ha jiri ohere ọma ahụ kpọrọ ihe.

Ha kpekwazị̀rị̀ ka mkpụrụobi Gilbert Ibezim na Chizoba Ibezim gaa n’ihu izu ike udo.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles