33.3 C
Nigeria
Saturday, April 27, 2024

FCET Anabatala Ụmụakwụkwọ Ọhụrụ n’Umunze

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kọwaala mkpà ọ dị ka ụmụakwụkwọ mụọ ọrụaka dị icheiche ga-enyere ha aka ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha na ndị na-ekepụ̀ta ohere ọrụ mgbe ha gụchara akwụkwọ.

Onyeisi ụlọakwụkwọ ‘Federal College of Education Technical Umunze (FCET), Dọkịta Theresa Okoli bụ ya nyere nkọwa ahụ na ndụmọdụ ahụ n’okwu ya na mmemme ịnabata ụmụakwụkwọ batara ọhụrụ n’ụlọakwụkwọ ahụ.

Oke mmemme nnabata ụmụakwụkwọ ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee kọwaara ụmụakwụkwọ ahụ ihe dị icheiche ha kwesiri ịma banyere ụlọakwụkwọ ahụ, ma dukwa ha n’iyi ka ha wee na-erube isi nye iwu na-achị ụlọakwụkwọ ahụ.

N’okwu ya n’ebe ahụ, ya bụ onyeisi ụlọakwụkwọ, bụ Dọkịta Okoli jiri obi ụtọ wee nabata ụmụakwụkwọ ahụ batara ọhụrụ na ya bụ mahadum ahụ, ma chètara ha na ọ bụ mmasị Chineke na ha ga-abụ ụmụakwụkwọ nọ na-agụ akwụkwọ ebe ahụ n’oge dịka oge a.

Ọ kọwara mahadum ahụ dịka otu n’ime dị elu kachasị mma n’ụwa gbaa gburugburu, ma bụrụkwa nke nwere ngalaba ọmụmụ ihe dị icheiche na-eweta ụsa nye nsogbu dị icheiche na-échéré mba ụwa aka mgba.

Dọkịta Okoli kpọkuru ụmụakwụkwọ mahadum ahụ, ọkachasị ndị nke batara ọhụrụ, ka ha dị uchu n’agụmakwụkwọ ha ma gụsie akwụkwọ ike, iji nwee ezi mpụtara ma bụrụ ndị gọọmentị na ụlọọrụ dị iche iche ga na-achọgharị ka e wee ha n’ọrụ, ngwangwa ha gụchara akwụkwọ.

Ọ gara n’ihu tòó ụmụakwụkwọ ahụ maka ọgụgụisi ha, ma kpọkuo ha ka ha bụrụ ndị na-aña ntị nke ọma, na-erube isi na ndụmọdụ, ma na-agbasòkwa ntụziaka, ka ha wee ghara ịkwa ngarammara ma e mechaa.

Ọ gwakwara ha ka ha zèéré ihe ọbụla bụ akparamagwa ọjọọ, dịka ịba n’otu nzuzo, ígwù ojoro n’ule, izu ohi, ịgba akwụna, ime enyi ọjọọ, ịtụ asị na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ, bụ nke nwere ike imebi aha ha maọbụ kpụtọọ ùgwù ha; ọbụna dịka ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-ekpesikwa ekpere ike, ma na-achụsòkwa ezi mpụtàrà. O chetaara ha na ọ bụ akwụkwọ ka nne na nna ha zitere ha ka ha bịa gụọ n’ebe ahụ, ya na ịmụ̀tà ihe dị icheiche ga-enyere ha aka ịba uru na ndụmọdụ.

Ya bụ onyeisi mahadum jikwazị̀ ohere ahụ kelee ụmụakwụkwọ ahụ maka mbàta ha na mahadum ahụ, ma nyekwazie ha owuweanya na ụlọakwụkwọ ahụ ga-aga n’ihu ịkwalite ọdịmma ha na ọnọdụ mmụta ha ogologo oge niile ha ga-anọ na mahadum ahụ.

Na nzaghachi ya n’aha ndị òtù ya oge a gbara ya ajụjụọnụ, ụfọdụ n’ime ụmụakwụkwọ ahụ batara ọhụrụ, bụ Chidiebele Okoli na Francis Okafor kwuru na mmemme ahụ emepeela anya ha ka ha mụtakwuo ọtụtụ ihe dị icheiche ha kwesiri ịma banyere mahadum ahụ na agụmakwụkwọ ha n’ebe ahụ. Dịka ọ na-ekele ndị haziri ihe mmemme, o kwèzịrị nkwa na ọ ga-agụsi akwụkwọ ya ike iji wee nwee ezi mpụtara mgbe ọ ga-achịkọta agụmakwụkwọ ya n’ebe ahụ.

E duru ụmụakwụkwọ ahụ n’iyi site n’aka onye ji ọkwa Rejistra ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Maazị Bessy Nkah.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles