28.5 C
Nigeria
Sunday, February 23, 2025




ASỤSỤ IGBO: Amụma Ndị UNESCO Agaghị Emezu — Kọmishọna Onyenji

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Kọmishọna na-ahụ maka Omenala, Obiụtọ na Njem Nlegharịanya n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Don Onyenji, ekwuola na amụma ahụ ndị otu mba ụwa ‘United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization (UNESCO)’ buru banyere asụsụ Igbo agaghị abịa na mmezu.

Kọmishọna Onyenji kwuru nke a n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, mgbe ya na onye nta akụkọ Izunna Okafor na-enwe mkparịtauka banyere mmemme ncheta ụbọchị asụsụ ọdịnala ndị (International Mother Language Day) nke ahọ 2025.

Ọ kọ̀wàrà na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị pụrụ iche òtù mba ụwa UNESCO wepụtara iji merube ma kwàlite asụsụ ọdịnala na ndị na-asụ asụsụ ọdịnala na mba ụwa gbaa gburugburu, ya na iji kọwaa mkpà ọ dị ịkwàlite asụsụ ọdịbendị. O mere ka a mara na asụsụ bụ isi sekpụ ntị n’omenala obodo ọbụla, bụ nke mere o jiri dị mkpa ka agbụrụ ọbụla kwàdo, kwàlite ma na-echekwaba nke ha oge niile, ka o wee ghara ịnwụ maọbụ fuo.

Kọmishọna Onyenji kwuru hoohaa na ámụmá ahụ òtù UNESCO buru sị na asụsụ Igbo ga-anwụ oge adịghị anya bụ nke adabàghị adabà, n’agbanyeghị na ha buru ya bụ ámụmá site na nchọcha ha mere. O kwupụ̀tàkwàzị̀rị̀ ezi olileanya o nwere na asụsụ Igbo agaghị anwụ, n’ihi na a ka nwere nde kwuru nde ụmụafọ Igbo ndị ka nwere mmasị n’asụsụ Igbo ma na-akwalitekwa ya, ma n’ala Nigeria ma na mba ofesi.

N’agbànyèghị̀ nke ahụ, ọ kwàrà arịrị na ọtụtụ omenala na njirimara ndị Igbo, ọ kachasị asụsụ Igbo, bụzị ihe a na-eleghara anya ugbua, nke mezịrị o jiri dị mkpà na onye ọbụla bụ ezi nwaafọ Igbo ga-atụnye ụtụ ma tinye aka n’ọrụ, iji zọpụta ma hụ na ya bụ asụsụ efùghị dịka e buru n’amụma.

Dịka ọ na-akọwa nà asụsụ na omenala so n’ihe kachara dị mkpa na ndụ mmadụ na àgbụrụ ọbụla; ọ kpọpụ̀tasịrị mbọ dị icheiche ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo na-agba nà atụmatụ dị icheiche gọọmenti steeti ahụ wepụtagoro iji kwàlite asụsụ na omenala Igbo, ọkachasị̀ n’ụlọakwụkwọ na ebe ndị ọzọ dị icheiche. O kwuru na gọọmenti mèrè ya ka ọ bụrụ iwu na ọ bụ naanị asụsụ Igbo ka a ga na-asụ ma bụrụkwa naanị ejiji ndị Igbo ka a ga na-eji n’ụlọakwụkwọ praịmarị na sekọndiri niile dị na steeti ahụ ụbọchị Wenezdee ọbụla.

Kọmishọna Onyenji rịọkwazị̀rị̀ ndị nne na nna na ndị òtu Igbo dị icheiche, ma ndị nọ n’ala Nigeria maọbụ mba ofesi ka ha na-echeta ebe ha sì, na-akụziri ụmụ ha asụsụ Igbo, ma na-atụnyekwa ụtụ nke ha na mgbe na mgbe n’ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo, n’ihi na ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya ma e tete ụra otu ụbọchị o wee bụrụ na asụsụ Igbo adịghịzị, maọbụ na ọ nwụọla kpamkpam dịka ụfọdụ asụsụ ọdịnala ndị ọzọ dị icheiche siri laa mmụọ. O kwuru na onye ọbụla tụfuru maọbụ chefuo asụsụ ọdịnala ya echefuola ma tụfuo njirimara ya, n’ihi na ihe abụọ ahụ na-agakọ ọnụ.

O mere ka a mara na ọ bụ nnukwu ihe arụ mmadụ iti nwata ihe maọbụ nye ya ntaramahụhụ maka na ọ sụrụ asụsụ Igbo. Ọ gara n’ihu kọwaa na ọrụ ịkwalite asụsụ na omenala Igbo bụ ọrụ dịịrị onye Igbo ọbụla, maka na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahigeaja.

N’ịgbakwàsà ụkwụ n’isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a, Kọmishọna Onyenji katọrọ ma gbarụọ ihu banyere akparamagwa ụfọdụ ndị Igbo, ndị na-ekwu na asụsụ Igbo abàghị̀ uru ọbụla maọbụ nà asụsụ Igbo na-eme ha ihere.

Dịka ọ na-ekwu na oge agaala mgbe a na-ahụta ndị na-asụ asụsụ Igbo dịka ndị amaghị akwụkwọ, ya bụ Kọmishọna, onye kwuru na asụsụ Igbo dị ụtọ, gàkwàzị̀rị̀ n’ihu kpọpụ̀tasịa ọtụtụ uru dị icheiche dị na mmadụ ịsụ asụsụ ọdịnala ya, ma kwukwa na onye Igbo kwesiri iji asụsụ ya na-eme ngala.

Ọ kpọpụ̀tasịkwàrà ọtụtụ ụmụafọ Igbo dị icheiche a na-anụ áhà ha anụ n’ogoogo mba ụwa na ngalaba dị icheiche mana ha niile na-asụcha asụsụ Igbo nke ọma, nke gosiri na ịsụ asụsụ Igbo egbòchìghị̀ mmadụ ọbụla ịbụ ihe ọ chọrọ ịbụ maọbụ iru ogoogo o kwesiri iru n’ụwa. O mere ka a mara na ọ dị̀kwà mma ka mmadụ mụtakwa ụfọdụ asụsụ ndị ọzọ dị icheiche, ma kwuo na nke kachasị mkpa bụ na onye ahụ kwesiri ibu ụzọ mụta asụsụ ọdịnala ya, wee tinyeziere asụsụ ndị mba ọzọ.

Onyenji kèlèrè gọọmenti steeti Anambra ọzọ maka ezi atụmatụ dị icheiche o wepụtagoro iji kwalite asụsụ na omenala Igbo, ma kpọkuzie ndị nne na nna, ndị nkuzi, ndịisi ụka, ndị ndu obodo, ụlọọrụ na òtù dị icheiche, na onye ọbụla bụ onye Igbo, ka ha sonyesie ike, nye aka, ma tụnyekwa ụtụ nke ha n’ịkwàlite asụsụ na omenala Igbo, maka na ọ na-abụ e jikọọ aka wee buo ozu enyi, ọ dị mfe.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles