23.2 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

APGA na JNF Ekpebiela Ikwadò Ndị Ntorobịa n’Egwuregwu

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Isi ọchịchị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ n’ala Nigeria ekpebiela ikwadò ngalaba ndị ntorobịa otu ahụ site n’atụmatụ egwuregwu na atụmatụ ndị ọzọ dị icheiche.

Onyeisioche otu ndọrọndọrọ ahụ, bụ Ọkaiwu Sly Ezeokenwa bụ ya kwupụ̀tàrà nke a oge ndị òtù ‘Jordan Nwora Foundation’ bịara kpọtụrụ ya n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ụbọchị Wenezdee.

O toro onye hibere òtù ahụ, bụ Maazị Jordan Nwora, onye bụ onye egwu bọọlụ̀ a ma ama n’òtù egwu bọọlụ̀ ‘United States National Basketball Association (NBA)’, ma kelee ya maka mkpebi ya inyeghachi obodo ya, site n’ihibe òtù ahụ na atụmatụ ahụ.

Ọ kpọpụ̀tàsị̀rị̀ uru dị icheiche ga-apụ̀ta site na njikọaka òtù ahụ na gọọmenti steeti Anambra; ma kwukwazie na APGA dị njikere ijikọ aka ọnụ, ya na otu Nwora ahụ, iji si n’ụzọ dị etu ahụ kwàlite ndị ntorobịa ma nyekwa ha ohere ọma dị icheiche iji mee ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha ma bakwara obodo uru site n’ụdị egwuregwu dị icheiche.

N’okwu nke ya n’ebe ahụ, Onyeisioche otu ndọrọndọrọ APGA n’Anambra, bụ Ọkaiwu Ifeatu Obi-Okoye tinyekwàrà olu wee kelee otu ‘Jordan Nwora Foundation’ maka mkpebi ha, mbọ ha gbagoro, nà ntụnye dị icheiche ha megoro n’ịkwàlite ndị ntorobịa n’ụzọ dị icheiche; ọbụna dịka o kwere ha nkwa na gọọmenti steeti Anambra ga-aga n’ihu inye ha nkwàdó.

Na mbụ n’okwu ha n’otu n’otu, Onyeisi òtù ‘Federation International Basketball Ball Association (FIBA) Zone 3’, bụ Maazị Sam Ahmedu; Onyeisi otu ‘Jordan Nwora Foundation’, Maazi Alex Nwora; na Maazị Anthony Nwora, kọ̀wàrà nà mmasị ha isonye n’otu ahụ gbàdòrò ụkwụ na mmasị onye hibere òtù ahụ nwere n’iwulite ọdịmma ndị ntorobịa, nà ịtụnye ụtụ na mmepe obodo.

Ha kpọpụ̀tàsị̀rị̀ atụmatụ dị icheiche o ji n’aka, ma kwupụ̀takwa ihe dị icheiche ha mepụtagoro na nsonso, nke gụnyere inye ndị ntorobịa iteghete ohere n’efu na mba ofesi; nke ha kwukwara na ha ga-etinyekwu mmadụ atọ ọzọ na ya oge adịghị anya.

Ha dụ̀kwàzị̀rị̀ ndị ntorobịa ka ha jiri egwuregwu na ohere ọma ọbụla bịara n’ụzọ ha wee kpọrọ ihe, maka na uru dị na ya karịrị ihe ụfọdụ na-echè.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles