30.7 C
Nigeria
Sunday, April 28, 2024

Ala Naịjiria Ebegbuo Onwe Ya n’Akwa

 

Izunna  Okafor dere abụ a

Ala Naịjiria ebegbuo onwe ya n’akwa
Anyammiri, anyammiri ebe niile!
Ákwá ụtụtụ, ákwá ndeeri na ákwá arị̀rị̀
Ọnye ga-azọ ala anyị?

Chi ọbụbọ wèré aka èkpè dupụta ya ụra
Chi ọjọọ ewere akwa arị̀rị̀ dúbàá ya
Ihe na-ebenụ a ka na-ebekwa
Onye ga-azọ ala anyị?

Naịjiria bụ nne chị ụmụ
Onyeisiala bụ di ọ lụrụ
Nne na ụmụ ebegbuo onwe ha n’ákwá!
Agụụ, anyammiri, akwa arịrị ebe niile
Onye ga-azọ ala anyị?

Lekene nwaanyị na mma ya
Na ụbara ụmụ chi jiri gọzie ya
Mana di ya na ndị òtù ya ekweghị ka o rite ihe nwa ya
Ha wee na-amị ya ọbara ka anwụnta Nnewi
Onye ga-azọ ala anyị?

Ezinụlọ ya nọ n’ọgbaaghara
Mana di ya anaghị emedị ka nwoke
Égbé ebukọchaala ụmụ ya
Ndị e gburu egbu akarịa ndị dị ndụ
Mana di ya emeghị ihe ọbụla maọlị
Dịka a gà-asị na ọ macha ihe na-eme
Gbachị nkịtị
Onye ga-azọ ala anyị?

Di ya ezugbuola ya n’ohi, ma bube ya ọnụ nri
Ụmụaka ya nọzịkwa n’agụụ, ọbụnadị n’ime ikpo nri ha nwèrè
Ya bụ ògòlì nwaanyị agbaa isi awọ n’erughị eru
Anyammiri ejugokwa ọgọdọ ya
Onye ga-azọ ala anyị?

Nwoke ahụ agbaala ya ọtọ n’ọmà ahịa
Chaị!
Agụ nwaanyị ebegbuo onwe ya n’akwa!
Dịka ụwa na-agbázịkwa ọtọ ya elele
Ùgwù e jiri mara ya erughịzịkwa ya aka
Onye ga-azọ ala anyị ?

Oge adịghị anya, ala Naịjiria na-achọ di ọzọ
Ndị ọ lụrụ alụ agharịpụchaala ya
N’ihi ezùghị òkè n’ihe e ji nwoke eme
Nke bụ di ya ugbua anaghị echètékwuzị onwe ya
N’ihi ụbụrụ ịta nchara
Na ihe a gwọrọ agwọ so ya
Onye ga-achị ala anyị?

Iwe eweela ụmụ ya ndị okenye
Ha ji kwekọrịta ịchọrọ nne ha di ọzọ
Naanị nwoke nwere ùgwù na nsọpụrụ
Ka a na-elegara anya ibunye mmanya ụbọchị ahụ
Ma e wepuchaa úgwùmágànà na ndị òtù ya
Ụmụnne m, ajụọ m, onye ga-alụ mama anyị?

Gị onwe gị sòrò bụrụ nwa ya
Mụ onwe m sòrò bụrụ nwa ya
Ngịga dị n’ọkụ abụghị nkè azụ
Ọ̀ bụ́rụ́ nkè anụ
Ajụọ m ọzọ
Onye ga-alụ mma anyị ?

Jidesie PVC gị ike ugbua
Ka i wee soro zaa ajụjụ a
N’oké ụbọchị ahụ na-abịa nso
Ka anyị lụtara mma anyị di ọzọ
Maka na ndị nke ọ lụrụ alụ emewaala ya obi
Bikonụ̀ ụmụnne m, ajụọ m ọzọ
Onye ga-alụ mama anyị ?

© Izunna Okafor.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles