28.8 C
Nigeria
Saturday, April 27, 2024

Akụkọ Ifo: Mbe na Nwunye Eze

 

Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

Ifo chakpii – wọọ

Chakpii– wọọ

Nkịta nyara akpa…

Nsi agwụ n’ọhia

O ruru otu oge, mbe gara n’ime ọhịa ịgba nta. Ka ọ nọ na-achọ anụọhịa ọ ga-egbu, ọ hughị. Ọ nọrọ ala otu ebe na-ezu ike. Ka ọ nọkatara ọ nụrụka ihe na-emeghari n’akụkụ ụzọ, ozigbo ọ gbaa egbe ebe ahụ.

Mgbe ọ garuru nso, ọ chọpụtara na ọ bụ nwunye eze na-agafe n’akụkụ ụzọ ka ọ gbagburu. Ihe a wụrụ ya akpata oyi, egwu wee jide ya nke mere na ọ makwaghị ihe ọ ga-eme. O were akwụkwọ osisi dị icheiche kpuchie ozu nwaanyi ahụ.

Dịka anyi maara, mbe bụ anụmanụ na-aghọ aghụghọ. Ya mere, ochetara ihe ọ ga-eme. O biliri gaa n’ụlọ ezi wee si ya bịa ka ha gaa nta. Ezi kwetara, wee soro ya gaba.

Ka ha ruru n’ime ọhịa, mbe kpọọrọ ya gaa n’ebe ahụ ozu nwunye eze togbọ, wee tụọ aka si ya gbaa egbe na anụmanụ nọ n’ebe ahụ. Ozigbo ezi gbara egbe, mbe gbara ọsọ ga kpughee akwukwọ osisi ahụ o jiri kpuchi ozu, weetie mkpu si ezi na o gbuola nwunye eze. Mbe tiri mkpu hapu ezi gbalaga.

Ozugbo ahụ ezi biliri gaa na nke Ọtụaro, wee gwa ya ihemerenụ. Ọtụarọ gwara eze ka ọ gaa ahịa zụkọta akwa na ogọdọ, tinyere akpu na ihe niile ndị Eze ji eme ọgaranya. O gotechaa ha, ya yiri ihe ndị ahụ gaa na be mbe gwa ya na ọ bụ ihe ndị eze nyere ya iji kele ya maka igbu nwunye ya, onye ọ na-achọ igbụ kemgbe, n’ihi na ọ bụ ajọ nwaanyi.

Ezi mere dịka ọtụ aro gwara ya wee yiri ihe ndị ahụ gaa be mbe. Mgbe Mbe hụrụ ya o tiri mkpu wee sị ya; “Eze, olee mgbe I jiri bụrụ ọgaranya?

”Ezi zara ya sị, “Enyi m nwoke, ọ bụ ihe ndị Eze nyere m, o ji kele m maka igbunwunye ya nke ya na-achọ igbu egbu kemgbe.”

Ka Mbe nụrụ nke a, o tikapụ ọsọ gbara gaba be Eze wee gwa ya na ọ bụ ya gburu nwunye ya na ọ bughị Ezi.

Ozigbo ahụ, a kụrụ ekwe kpọkọọ ọha obodo, wee jide Mbe, gbuo ya.

IHE MMỤTA: Onye aghụghọ nwụọ onye aghụghọ e lie ya.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles