28.8 C
Nigeria
Saturday, April 27, 2024

ACTDA Agaala n’Ihu Ịkụtùsì Ihe a Rugasịrị Ebe Iwu Akwadòghị n’Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na agadi nwaanyị kachie ntị wụfèé aja, e bute ozu ya n’ofete nke ọzọ.

O wee bụrụ etu ahụ ka ụlọọrụ ‘Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA)’ siri wee gaa n’ihu ịkụtusìkwù ihe dị icheiche a rụrụ n’ebe iwu akwdòghị na mpaghara ebe dị icheiche na gburugburu Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ ọrụ ịkụtùsì ụlọ bụ nke ụlọọrụ ACTDA bagidere site na njikọaka ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ dị icheiche, nke gụnyere ndị uweojii, ụlọọrụ ‘Nigerian Security and Civil Defence Corps (NCDC)’, ‘Anambra State Joint Enforcement Team (ANJET)’, na ụlọọrụ ‘Operation Clean and Healthy Anambra (OCHA Brigade)’. Ebe a kụtusiri ihe ndị ahụ gụnyere mpaghara UNIZIK Tempsite, Regina Caeli Junction, Oby Okoli Avenue, Okpuno, Abakiliki Street, na mpaghara Club Road.

Ụfọdụ ihe dị icheiche a kụtusiri ụbọchị ahụ gụnyere ụlọ ndị e kwuru na a rụrụ n’usoro/ụzọ iwu akwadoghị, ndị ọzọ a rụchiri n’ebe okporoụzọ si aga, na nke ụfọdụ ndị mmadụ na-arụ n’ala abụghị nke ha. ACTDA nọkwàrà na nsonso a wee kàá akara nkụtù n’ụfọdụ ihe ndị ọzọ a rụrụ ebe ekwesighị ekwesi, ma gwakwa ndị nọ na ha ha kwapụ̀ maka na a ga-akụtu ha oge adịghị anya.

N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ‘Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA)’ bụ Maazị Ossy Onuko gbarụrụ ihu banyere otu ụfọdụ ndị mmadụ si arụnyesi ihe ebe ekwesighị ekwesi na steeti ahụ, ọkachasị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, bụ nke o kwuru na gọọmenti na-agbasi mbọ ike ka o nwògharịa.

O kwupụtàrà mwute ya banyere etu ịzụ ahịa n’okporoụzọ si arị ibe ya elu n’okporoụzọ dị icheiche dị na mpaghara Awka na n’ebe ndị ọzọ, n’agbànyèghị̀ mbọ dị icheiche gọọmenti na-agba iji gbochie nke ahụ. O mekwara ka a mara kwuo na gọọmenti agaghị anabatazị nke ahụ chaachaa malite ugbua gaba, bụkwazị nke mere ụlọọrụ ya jiri kpebie itinye ihe mgbochi ahụ.

O kwuru na ịkụtùsì ihe ahụ bụ nke dabara adaba n’ebumnobi ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo nà mbọ ọ na-agba inwògharị̀ na iwulite ọnọdụ mmepe steeti ahụ; ma kwuo na ọ dị mma ka ndị mmadụ mụ̀ta otu e si erube isi n’usoro iwu ma na-agbasòkwa ntụziaka gọọmenti n’ihe dị icheiche ha na-eme.

Ọ kpọpụtasịkwara ọtụtụ ihe égwù na ihe izendụ dị icheiche dị n’ịzụ ahịa n’okporoụzọ ụzọ, nke gụnyere ọnwụ sitere n’ihe mberede okporoụzọ, na ọtụtụ ihe égwù ndị ọzọ; ọbụna dịka o kọwakwara na ịzụ ahịa n’okporoụzọ na-ebutekwa agbakata akwụrụ dị égwù n’okporoụzọ, tinyere ọtụtụ ihe égwù ndị ọzọ jupụtàrà na ha.

O mere ka a mara na ebumnobi ha ji akụtùsi ihe ndị a rụrụ ebe ekwesighị ekwesi abụghị iji megide maọbụ mekpàá ụmụ mmadụ ahụ, kama na ọ bụ ọrụ dịịrị ha ịhụ na a na-agbaso usoro kwesiri ekwesi na usoro iwu kwadoro wee na-arụ ihe dị icheiche a na-arụ n’Awka, dịka o siri daba adaba n’ebumnobi mmasị gọọmenti inwògharị̀ steeti ahụ.

O nyekwara ndị na-arụ ihe ndị ọzọ ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ na-enweta ikike na nkwàdo site n’aka gọọmenti tupu ha amalite ịrụ ihe ọbụla ha na-arụ, maka ịkwa ‘ngara m mara’ n’oge ikpeazụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles