28.2 C
Nigeria
Wednesday, May 8, 2024

ACTDA Adọọla Aka Na Ntị Ọzọ Megide Ịzụ Ahịa n’Okporoụzọ

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti steeti Anambra agbarụọla ihu banyere etu ndị mmadụ si aga n’ihu na-ebugharị ma na-azụ ahịa n’okporoụzọ ebe ụgbọala si aga, n’agbànyèghị̀ ọkwa dị icheiche a magoro banyere nke ahụ.

Onyeisi ụlọọrụ ‘Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA)’ bụ Maazị Ossy Onuko bụ ya gosipụtàrà obi mwute a n’okwu ya oge ọ gara ileta ka ọnọdụ si gbata kwụrụ n’ebe ahụ ụlọọrụ ya rụnyesiri ihe mgbochi na mpaghara ebe ahụ ndị mmadụ na-ere ma na-ebugharị ahịa n’okporoụzọ n’ahịa Eke Awka dị n’isi obodo steeti Anambra.

O kwupụtàrà mwute ya banyere etu ịzụ ahịa n’okporoụzọ si arị ibe ya elu n’okporoụzọ dị icheiche dị na mpaghara Awka na n’ebe ndị ọzọ, ma kwuo na gọọmenti agaghị anabatazị nke ahụ chaachaa malite ugbua gaba, bụkwazị nke mere ụlọọrụ ya jiri kpebie itinye ihe mgbochi ahụ.

Maazị Onuko gàkwàrà n’ihu kwuo na ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ na-agbasi mbọ ike iji nwogharịa ma kwalite ahịa dị icheiche dịgasị na steeti ahụ ka ha nọrọzie n’ogoogo mba ụwa, ma kwuo na ha agaghị anabata ihe ọbụla nwere ike ịdọghachi aka elekere azụ maọbụ bụrụ ihe ogbochi banyere mkpebi na atụmatụ ahụ.

Ọ kpọpụtasịkwara ọtụtụ ihe égwù na ihe izendụ dị icheiche dị n’ịzụ ahịa n’okporoụzọ ụzọ, nke gụnyere ọnwụ sitere n’ihe mberede okporoụzọ, na ọtụtụ ihe égwù ndị ọzọ; ọbụna dịka o kọwakwara na ịzụ ahịa n’okporoụzọ na-ebutekwa agbakata akwụrụ dị égwù n’okporoụzọ, tinyere ọtụtụ ihe égwù ndị ọzọ jupụtàrà na ha.

O dọkwàzị̀rị̀ aka na ntị na onye ọbụla ọzọ a ga-ahuzị ka ọ gáfèrè ebe ahụ a rụrụ ya bụ ihe mgbochi wee nọrọ n’okporoụzọ na-azụ maọbụ na-ebugharị ahịa, ga-abụ onye a ga-ejide ma nyekwa ya ntaramahụhụ kwesiri ya, dịka ọ dị n’usoro iwu.

Ọ gakwara n’ihu kpọkuo onye ọbụla na steeti ahụ ka o nye aka n’ịkwàlite ezi ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà na mpaghara ha, ọkachasị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, dịka ọ bụ ihe dị oke mkpà ga-ényékwa aka n’ịkwàlite mmepe na ịma mma nke steeti ahụ.

Related Articles

LEAVE A REPLY

Please enter your comment!
Please enter your name here

Latest Articles